ASCSDA Ekwe Nkwà Ikesàkwùrù Ọtụtụ Ime Obodo Ego Ọrụ n'Izuụka Ọzọ

Oru Aka
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ụlọ ọrụ 'Anambra State Community and Social Development Agency', (ASCSDA) bụ ụlọ ọrụ mmepe ụlọ ọba ego mba ụwa na-enye nkwàdo na steeti Anambra ekwuola na ọ ga-amalitekwa ikesàkwùrù ụfọdụ ime obodo dị iche-iche na steeti ahụ ego iji kwàlite atụmatụ ọrụ mmepe malite n'ụbọchị Mọnde izuụka na-abịa abịa.

Ọ bụ onyeisi ụlọ ọrụ ahụ, bụ maazị Chudi Mọjekwu kwupùtara nke a na mmemme inye ọzụzụ mkpụrụ ụbọchị abụọ, bụ nke a chịkọbààrà ndị a họpụtara isonyè n'òtù ọrụ dị iche-iche n'ịhazi ya bụ atụmatụ n'okpuru ọchịchị ndị ahụ a ga-ekesàra ego n'izuụka na-abịa abịa, nke gụnyere okpuru ọchịchị Awka South, Anambra East, Anambra West na Dunukọfịa.

O mere ka a mara na ego ahụ bụ naanị maka ụmụ obere ọrụ mmepe dịgasị iche-iche, dịka ọ dị atụmatụ mmepe obodo ma ọ bụ atụmatụ mmepe òtù ahụ, bụ 'Community Development Plans' (CDPs) ma ọ bụ 'Group Development Plans' (GDPs) n'otu n'otu; ma gwakwa ha na a ga-enye ha akwụkwọ ozi ikike sitere ụlọ ọba ego mba ụwa ma ọzụzụ ahụ bịa na njedobe, iji nwe ike ide akwụkwọ ịdọrọ paseentị iri atọ n'ime ego niile a ga-eji rụọ ya bụ ọrụ n'okọuru ọchịchị ha dị iche-iche.

Ọ gakwàzịrị n'ihu kwuo na site n'okpuru amụmà ọrụ ahụ, na Enugwu-Agụleri dị n'okpuru ọchịchị Anambra East arụọla ụlọ ezumeezù, bụ ebe ụmụnwoke na ụmụnwaanyị obodo ahụ ga na-enwe nzukọ ha.

Na ntụnye nke ya, onye na-ahụ maka ọrụ n'okpuru atụmatụ ahụ, bụ Operations Manager, Oriakụ Uche Nwizugbo rịọkwàrà ndị ahụ ka ha na-echèta ndị ọlụsị, mgbe ha na-arụnye ihe ọbụla ha na-arụ, iji wee na-arụnyere ha ebe ha ga-esi na-aga.

N'ozi ekele ya n'aha ndị òtù ọrụ ahụ e nyere ya bụ ọzụzụ, maazị Chuks Ilozue sitere okpuru ọchịchị Dunukọfịa bunyèrè gọọmenti steeti ahụ ụkpa ekele maka ya bụ ọmarịcha atụmatụ. O kwèkwazịrị nkwa n'aha ndị ògbò ya, na ha ga-arụ ọrụ ahụ a hànyèrè ha n'aka nke ọma nakwa otu o siri kwesi, iji mezupùta ebumnobi e jiri guzobe ya bụ atụmatụ.