Anambra Ga-Achọ Ijeri Abụọ Maka Ụgwọ Ọrụ Opekatampe

Oru Aka
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Aka na-achị Anambra Steeti, Gọvanọ Willie Obiano, ekwuola hoohaa na steeti ahụ ga-achọ ijeri naira abụọ n'ọnwa ọ bụla iji were kwụọ ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ.

Ọ kwusịrị ike bụ njikere gọọmenti ya dị iji were bụrụ ndị mbụ ga-akwụ ụgwọ ọrụ opekatampe ọhụrụ ahụ nye ndị ọlụ n'ala anyị maka ma onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya.

Ọ sịrị na steeti ga-akwalite ego ndị ahụ ha na-enweta n'ime steeti ahụ iji were kwadoo ije ozi a dị oké mkpa. Obiano bụ onye mere ka amata nkea na nzukọ ya ndị isi mgbasa ozi mere n'ogige ya dị na Aguleri, na ọchịchị ime obodo Anambra East na steeti ahụ.

Ọ kwuru na ibido ịkwụ ụgwọ ọrụ opekatampe ọhụrụ ahụ ga-etinye ihe karịrị ijeri naira abụọ n'elu ego ụgwọ ọrụ gọọmenti steeti ahụ na-akwụ n'ọnwa ọ bụla.

Obiano kwuru na ọ ga-akwụ ụgwọ ọrụ opekatampe ọhụrụ ahụ dịka o kwere ndị ọrụ nọ steeti ahụ nkwa n'oge ntụliaka.

Ọ gara n'ihu were kwuo mkpa ọ dị ịbulite ego gọọmenti na-enweta na steeti ahụ n'ihi na nkea ga-eme ka gọọmenti nwee ike were rụọ ọrụ ndị ọzọ na-ebute mmepe.

Obiano kwuru na ngwa ngwa ọ kwụchara ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ, ọ ga-agbata ọsọ enyemaka na ụlọ ọrụ redio nke steeti nwe.