Gọọmenti Etiti Ga-ewe Mmadụ Puku Isi Asaa na Ise N'Ọrụ Ugbo

Oru Aka
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Gọọmenti Etiti nọrọ ụbọchị Wednezdee kwupụta ebumnobi ya iwe mmadụ puku iri asaa na ise n'ọrụ ugbo iji were tute mmụọ ndị ọrụ ugbo n'ịkọpụta nri. N'otu aka ahụ, o kewapụtakwara Otu Nzukọ maka Azụ nke Naijiria, nke nwere ebumnuche ịkwalite ịzụ azụ n'ala anyị dịka Naijiria mechiri oké ala ya niile n'ebe ịtụbata azụ n'ala anyị.

Onyeisi Ngalaba Ọrụ Ugbo na Mmepe Ime Obodo nke Gọọmenti Etiti, Mustapha Shehuri, kwupụtara atụmatụ gọọmenti nkea iji wee mmadụ puku iri asaa na ise n'ọrụ na Maiduguri, Borno Steeti, oge o mere njem nleta akọrọngwa nke Ngalaba Gọọmenti Etiti na-ahụ maka Ọrụ Ugbo na Mmepe Ime Obodo n'akụkụ ọwụwa anyanwụ mgbago ugwu ala anyị.

Shehuri kwuru na ngalaba gọọmenti etiti ahụ dị njikere ịnye ụsa gbasara ọtụtụ ihe ichere aka mgba dịrị ọrụ ugbo dịka ike ọ natara n'aka onyeisiala si dị. O gara n'ihu kwuo na-agbanyeghị ọtụtụ ihe ndaghachi azụ n'ebe nchekwa dị, oge dị mma na-echighata azụ nwayọọ, na ugbu a, ọrụ ugbo enyela ụmụ afọ na-eto eto Naijiria karịrị pacenti iri isii ọrụ.