Ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ màka njem siriri-wèrèrè n'okporo ụzọ n'ala Nigeria, bụ ụlọ ọrụ 'Federal Road Safety Corps, (FRSC)' ngalaba ya nke steeti Anambra agbapeela amụma njem awele nke ọnwa Mbà nke ahọ 2019.

Otu n'ime gbọelu ndị nje m n'ala anyị a na-akpọ Ikuku Udo (Air Peace) ka akpọrọ dịka ụlọọrụ bụ ọkaibe nke afọ 2019 na ụlọọrụ pụrụ iche nke ndị mmadụ. N'ozi ha wepụtara, ụgbọelu njem ahụ kwuru na onyeisi akụnụba na nhazi ọrụ ya, Oriaku Ejiroghene Eghegha, natara nturuugo ahụ n'aha ụlọọrụ Ikuku Udo (Air Peace).

N'iji bèlata oke ihe mberede okporo ụzọ, gọọmenti okpuru ọchịchị Nnewi South, nke steeti Anambra azọpụla ụkwụ dike ijikọ aka ọnụ, ya na ndị òtù ọrụ ala anyị na-ahụ maka ije awele na nchekwa okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ 'Federal Road Safety Corps'.

Akpọkuela Gọọmenti Etiti ka ha wepụ ego mgbakwụnye na mmanụ ụgbọala. Nke a ka onyeisioche International Monetary Fund, Christine Lagarde, kwuru na ọ bụ ihe ziri ezi ma kwesikwa ekwesị ime.

More Articles ...

Page 1 of 2