Ọdụ Ụgbọelu Sam Mbakwe na Owerri Agbaala Ọkụ

Njem
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Chi ewerela ehihie jie na Mọndee n'ọdụ ụgbọelu Sam Mbakwe dị na Owerri, isi obodo Imo Steeti. Ọkụ ahụ bụ nke gbara na ebe ahụ ndị njem si abata n'ọdụ ụgbọelu ahụ.

Ebe mmiri si were baa n'opi ụgbọgụrụ bụ nke a na-amataghị mana ọkụ ahụ gbara bụ nke gbara ebe a na-arụgharị arụgharị n'ọdụ ụgbọelu ahụ. Ọkụ ahụ bụ nke bidoro oge ọ na-akụ elekere abụọ nke ehihie.

Ọ bụ site na-enyemaka na ịgba mbọ nke ndị ọrụ na-emenyụ ọkụ na ndị na-arụ ọrụ n'ọdụ ụgbọelu ahụ mere e ji kwụsị ọkụ ọgbụgba bụ nke jiri nkeji iri ise were mebie ihe. Ọkụ ahụ lara ọtụtụ ihe n'iyi mana m kwụsị a kwụsịrị ya n'oge mere ka ọ hapụ ị ka njọ mana ekele dịrị Chukwu na o nweghị onye nwụrụ na ya bụ ihe mberede.

Ndị na-ahụ maka njem na ọdụ ụgbọelu ala anyị bụ, FAAN, kwuru na ha amalitego nnyocha n'ihe kpatara ya bụ ọkụ ọgbụgba.