Wepụ Ego Mgbakwụnye Mmanụ Ụgbọala - IMF

Njem
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Akpọkuela Gọọmenti Etiti ka ha wepụ ego mgbakwụnye na mmanụ ụgbọala. Nke a ka onyeisioche International Monetary Fund, Christine Lagarde, kwuru na ọ bụ ihe ziri ezi ma kwesikwa ekwesị ime.

N'okwu ya n'ụbọchị Tọzdee na nzukọ njikọ ọnụ ha na ndị ụlọakụ ụwa na Washington DC, ka onyeisioche ahụ mere ka amata na n'ihi ego gọọmenti na-enweta gbakwụnyere oge ole oruru n'isi otu onye, ọ bụ ihe dị mkpa ka gọọmenti wepụ ego mgbakwụnye mmanụ ụgbọala.

Site n'ime nkea, o kwuru na gọọmenti ga-enwe ike tinye ego ahụ na ịkwalite ọnọdụ ahụike, akwụkwọ na ọrụ mmepe obodo n'obodo ahụ.

Ụlọ ọrụ IMF nọrọ n'akwụkwọ o zitere Naijiria n'afọ puku abụọ na iri na iteghete rụtụ aka ná iwepụ ego mgbakwụnye na itinye ego ahụ n'ebe ndị ọzọ o kwesịrị ga-eme ka obodo dị mma, nyere ụmụ afọ aka ma chụọ ụbịam ọsọ ụkwụ eru ala; wepụtakwazie ọtụtụ ohere ga-akwalite ọnọdụ akụnụba ala Naịjiria.

Oge e chetara ya na ego mgbakwụnye mmanụ ụgbọala bụ nnukwu ihe n'ebe ụmụ Naijiria nọ, ebe ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ha na ụbịam gbara agbata obi, Lagarde gbadosiri ụkwụ ike n'okwu ya na ihe dị mkpa Naijiria aghaghị ime bụ iwepụcha ego mgbakwụnye mmanụ ụgbọala ahụ.

O kwuru, "A ga m egosi gị ka o si arụ ọrụ. N'ihi ọtụtụ ihe na otu ihe a ga-e si rụọ ọrụ, anyị kwenyere na iwepụ ego mgbakwụnye mmanụ ụgbọala bụ ụzọ kwesịrị ka a gaa. Ị lee anya n'ọnụ ọgụgụ Naijiria site na afọ puku abụọ na iri na ise, ihe karịrị dollar puku ijeri ise ka e tinyegoro n'ego mgbakwụnye mmanụ ụgbọala na mpụtara ya. Ndị na-eleba anya na ịkwalite ọnọdụ akụnụba achọpụtala na ego a ga-echekwa akụnụba na mmadụ ma ọ bụrụ na-akwụọ ụgwọ maka anwụrụ na-esite na mmanụ ndị a apụta n'afọ puku abụọ na iri na ise dị oké ọnụ. Ọnụ ọgụgụ ahụ bara ụba nke ukwuu.

Onyeisi ahụ kwuru na, "ọ bụrụ na nkea emee, a ga-enwe ọtụtụ ego a bụ nke a ga-etinye n'ọrụ ịkwalite ụlo ọgwụ, ịrụ ụzọ, ịrụ ụlọakwụkwọ na ị kwado akwụkwọ na ahụike ndị mmadụ."

Site na Janụwarị ruo Nọvemba afọ puku abụọ na iri na asatọ, ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmanụ na Naijiria, NNPC, tinyere ijeri narị naira isii na iri abụọ na atọ na ụma n'ebe ego mgbakwụnye ebe ha na-achọ ịnwetacha ihe niile.

N'agbanyeghị na ụlọ ọrụ ahụ kwuru na ego ahụ abụghị maka ego mgbakwụnye mmanụ ụgbọala dịka o nweghị ike maka nke ahụ, a chọpụtara site n'akwụkwọ ha gosiri gọọmenti na ọnwa Dicimba afọ puku abụọ na iri na asatọ, n'ego ha riri n'ọnwa iri na otu n'ebe ịnwetacha ihe niile dị dị ijeri narị naira isii na iri abụọ na atọ na ụma.