Ụgbọelu Ikuku Udo (Air Peace) Enwetala Nturuugo Ọkaibe

Njem
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Otu n'ime gbọelu ndị nje m n'ala anyị a na-akpọ Ikuku Udo (Air Peace) ka akpọrọ dịka ụlọọrụ bụ ọkaibe nke afọ 2019 na ụlọọrụ pụrụ iche nke ndị mmadụ. N'ozi ha wepụtara, ụgbọelu njem ahụ kwuru na onyeisi akụnụba na nhazi ọrụ ya, Oriaku Ejiroghene Eghegha, natara nturuugo ahụ n'aha ụlọọrụ Ikuku Udo (Air Peace).

Dịka ọ na-anata ya bụ nturuugo, Eghegha ka ozi kwuru na ọ sịrị na ọ bụ nnukwu ihe ọñụ ịmata na Ikuku Udo bụ ndị e tụnyere ugo dịka ụlọọrụ ọkaibe nke afọ a. "Obi jupụtara m n'ọñụ, na ndị ọrụ niile nke Ikuku Udo, ịmata na Ikuku Udo, Ụgbọelu njem kachasị na Ọdịda Anyanwụ Africa, bụ nke etunyere ugo ụbọchị taa dịka ụgbọelu njem nke tụnyere nnukwu ụtụ n'otito Ụlọọrụ Njem Elu Naijiria."

Eghegha tinyere na ụgbọelu njem ahụ ga-aga n'ihu n'ịchake site n'ịhụ na ha nyere ndị njem ha ezi nchekwa na njem elu kachasị. Ọ gara n'ihu were kwuo n'afọ ise nke ụgbọelu njem nwere ọtụtụ ihe aka mgba maka kwuo na site na njikọ aka ọnụ na ịhụ ụzọ nke ndị isi mere ụgbọelu ahụ jiri enweta ọtụtụ mmeri.

Nturuugo a, bụ nke Ụlọọrụ Mgbasa Ozi Akwụkwọ dị na Lagos chịkọbara, bụ nke onyeisi oche mmemme ahụ, bụ Ọkammụta Anya O. Anya tunyere, site na enyemaka Chief Marc Wabara na Oriaku Priscilla Oti.