A Kpokupla Ndị Anambra Ka Ha Makụọ Otu Ndọrọ Ndọrọ APGA...

A kpọkuola ụmụafọ steeti Anambra na ndị Igbo gbaa gburu gburu ka ha makụọ, bata ma were otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA dịka otu ndọrọ ndọrọ ha n'ihi ezi ọdịnihu, ịdị n'otu na agamnihu nke ahụ ga-ewetere ha.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Goomenti Steeti Rivers eliekotana igwe mmadu onu

N’akụkọ siri na-aka ndị Channels Television bịara anyị, gọọmenti Steeti Rivers eliena mmadụ 89 n’ime mmadụ 95 ndị ahụ ọkụ gbagburu n’ụbọchị Tọzdee. E likọtara ha niile ọnụ n’otu ọnụ ili n’Okobe. A chọpụtara ndị nwe mmadụ 6, were bunye ha ozu ndị nke ha. E liri mmadụ 86 ndị ọzọ a na-amaghị ndị nwe ha n’obodo Okobe dị n’okpuru ọchịchị Ahoada West.

Ọ bụ gịnị gburu ndị a? Ndị uwe ojii na Port-Harcourt na-ekwu n’otu ụgbọala tanka e ji ebu mmanụ petrol mebiri. Igwe mmadụ were gbakọọ ebe ahụ na-ezuru mmanụ petrol. Tanka ahụ mechara gbawaa, bọrọ ọkụ. Ọkụ gbagburu mmadụ 95. Mmadụ 18 merụrụ ahụ. Mkpamkpa a kpara n’ụtụtụ Tọzdee.

Ị ga-echete n’ụdị ihe a emego mbụ na Lagos, n’abalị 26 nke ọnwa Disemba afọ 2006. Ọkụ gbagburu igwe mmadụ ruru 300 ebe ha na-ezu oshi mmanụ petrol n’ebe ndị omekome kụpuru igwe paypụ na-ebu mmanu.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

A Kpokupla Ndị Anambra Ka Ha Makụọ Otu Ndọrọ Ndọrọ APGA...

A Kpokupla Ndị Anambra Ka Ha Makụọ Otu Ndọrọ Ndọrọ APGA...

A kpọkuola ụmụafọ steeti Anambra na ndị Igbo gbaa gburu gburu ka ha makụọ, bata ma were otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA dịka otu ndọrọ ndọrọ ha n'ihi ezi ọdịnihu, ịdị n'otu na agamnihu nke ahụ ga-ewetere ha.

Ndị Bishọọpụ Edegara Buharị Akwụkwọ Maka Ndị Otu Kristi A Mara Ikpe Ọnwụ...

Ndị Bishọọpụ Edegara Buharị Akwụkwọ Maka Ndị Otu Kristi A Mara Ikpe Ọnwụ...

Otu jikọtara ndị bishọọpụ n'ụwa gbaa gburu gburu bụ ndị a maara dịka 'World Council of Bishops" edegarala onyeisi ala Nigeria bụ maazị Mụhammadụ Buharị akwụkwọ banyere mmadụ ise ndị otu Kristi ahụ a mara ikpe ọnwụ n'abalị iri na otu nke ọnwa Juunu a, ma rịọ ka a tọhapụ ha.

Ndị Eze Ọdịnala Anambra Etoola Obianọ Maka Ezi Ọchịchị, Kwe Nkwa Ịkwàdò Ya...

Ndị Eze Ọdịnala Anambra Etoola Obianọ Maka Ezi Ọchịchị, Kwe Nkwa Ịkwàdò Ya...

Otu jikọtara ndị eze ọdịnala na steeti Anambra etoola aka na-achị steeti ahụ, bụ gọvanọ Willie Obianọ n'ihi ọtụtụ ọrụ ọma dị iche iche o ji n'aka nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ o mepụtagoro na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ.

Emeneka Agbapeela Mmiri Ọ Gbapuuru Ndị Ụmụeri...

Emeneka Agbapeela Mmiri Ọ Gbapuuru Ndị Ụmụeri...

Ụbọchị bụ nnọọ sọ ọñụ n'Obodo Ụmụeri dị n'okpuru ọchịchị Anambra East nke steeti Anambra dịka nwa amadi na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ahụ n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra bụ maazị Obinna Emeneka gbapeere ndị obodo ahụ mmiri ọhụụ ọ gbapuuru ha, dịka otu n'ime ọrụ ngo ya dịka onye nnọchi anya ha.

A Dụọla Ụmụakwụkwọ Ka Ha Dị Njìkere Tupuu Chọba Ohere Ọrụ...

A Dụọla Ụmụakwụkwọ Ka Ha Dị Njìkere Tupuu Chọba Ohere Ọrụ...

A kpọkuola ụmụakwụkwọ ka ha na-ejikere onwe ha nke ọma ma hụkwa na ha nwezuru ihe niile a chọrọ, tupuu ha amalite ịchọ ọrụ ma ọ bụ itinye akwụkwọ ka e wee ha n'ohere ọrụ.

Ọkụ Ọgbụgba: Gọọmenti Anambra Amachiela Ire Ihe Na-Adọ Ọkụ n'Ime Ahịa...

Ọkụ Ọgbụgba: Gọọmenti Anambra Amachiela Ire Ihe Na-Adọ Ọkụ n'Ime Ahịa...

N'ihi oke ọkụkụ ọgbụgba ahụ na-adapụtasị n'ime ahịa dị iche iche n'ala anyị, gọọmenti steeti Anambra akwàdola ma guzosie ike na mkpebi ahụ o nwere ịmachi ire ma ọ bụ zụọ ngwaahịa ọbụla na-adọ ọkụ n'ime ahịa ọbụla na steeti ahụ.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.