A Kpọkuola Ndị Igbo Ka Ha Na-Akwàdo Ọdịnala Na Omenala Ọjị

Ndụ Ndị Igbo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

A kọwaala ọjị dịka mkpụrụ osisi bara oke úrù, ma kọwaa mkpà ọ dị na Ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu ga na-echekwaba, na-akwàdo ma na-akwàlite nsọ, omenala, ọdịnala na ùgwù dịịrị ya bụ mkpụrụ osisi.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ ótù onye Ụkọchukwu Oseburụwa, ma bụrụkwa Ọkammụta na ngalaba nkà ihe ọmụma na Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ Ọkammụta Bobachristus Umeọgụ na nkuzi pụrụ ichè o nyèrè na nnukwu ọgbakọ nkuzi Mahadum ahụ, nke a kpọrọ 'Unizik Inaugural Lecture,' àgbà nke iri ise ya, bụkwa nkuzi nke isiokwu ha gbadòrò ụkwụ n'ịkọwa ihe omimi dị n'ọjị, ihe dị iche e jiri mara ya na ihe e ji ya eme n'ala Igbo, dịka o siri metụta omenala na ọdịnala.

Ka ọ na-akọwa ọjị dịka mkpụrụ osisi nwere ntị, ike na nghọta, ọ gara n'ihu mee ka a mara na ọjị abụghị mkpụrụ osisi nkịtị, dịka mkpụrụ osisi ndị ọzọ, kama na ọ bụ mkpụrụ osisi nwere mpụtara dị omimi, dịka nchọpụta nà nkwenye ndị Igbo siri dị, n'ihi na e ji ya ekpe ekpere, jiri ya na-agọ ọfọ, jiri ya na-ekpe udo, ma werekwa ya na-eme ihe dị iche iche n'usoro omenala na ọdịnala Igbo.

Ọkammụta Umeọgụ, onye bụkwa onye chọpụtara na onyeisi 'Igbo Village and Center for African Civilization (IVACAC)' na mahadum ahụ mere ka a mara na e nwegasịrị ụdị ọjị dị iche iche, na ihe ọjị ọbụla a wara awa na-egosipụta ma na-akọwa, dịka mpempe ma ọ bụ íbé ole ọ gbara siri dị, ma kwuo na ndị Yoruba na-akọ ọjị akọ, ndị Hausa na-ata ya ata, ebe ndị Igbo na-agọ ya agọ, na-akwanyere ya ùgwù, ma jirikwa ya na-eme omenala na ihe dị iche iche, dịka ọ dị malite n'okike ụwa.

Ka ọ na-akọwa ọjị dịka mkpụrụ osisi na-eweta udo, ịdịnotu na ọganihu, ya bụ Ọkammụta kwàrà àrịrị na nsọ ahụ dịịrị ọjị na ugwu ahụ ndị Igbo na-akwanyere bụzị nke na-anwụ anwụ n'ụfọdụ mpaghara ala Igbo taa, n'ihi na ọtụtụ ndị na-agbakụtazị nke ahụ azụ ma na-eleghàra ya anya, bụkwa nke ọ sịrị na ihe kpatara ya bụ na ụfọdụ ndị Igbo aghọtaghị ihe ya bụ mkpụrụ osisi pụtara na nkwenye ha, tinyere na ọtụtụ n'ime ha mụtazịrị iñòmi omenala ndị mba ọzọ, wee bụrụzie ọmụta ọgbakarị.

Ọkammụta Umeọgụ, onye kwuru na ọjị nwere óké na nwúnyè, kpọkùzịrị ma dụọ ndị Igbo ka ha jigidesie ugwu na nsọ dịịrị ọjị ike, ma na-akwàlitekewa omenala na ọdịnala ọjị n'ebe ọbụla ha nọ dịka ndị Igbo, ọbụnadị dịka ọ kọwara ọjị dịka ihe nwere ike ijìkọta agbụrụ na okpukperechi dị iche iche n'ala Nigeria ọnụ.

N'okwu ya bànyere nkuzi ahụ, onyeisi Mahadùm ahụ, bụ Ọkammụta Charles Esimone tòrò ya bụ nwa amadi nyere nkuzi maka otu o siri dọwaa okwu ahụ àgbà ma tọsaa ya n'ụzọ ọ ga-ekwe nghọta nyere onye ọbụla.

Dịka ọ na-agba aka ebe na ndị Igbo na-asọpụrụ ma na-akwanyere ọjị ùgwù malite n'okike ụwa, ọ kọwara ya dịka mkpụrụ osisi nwere ọtụtụ ihe mpụtàrà na nkwenye na omenala Ndị Igbo, nakwa mkpụrụ osisi nwere ike igbò nsogbu okpukperechi na agbụrụ na-ebì ala Nigeria aka ọjọọ, ma sịkwa na ọjị bara uru nke ukwuu n'ebe ọnọdụ ahụike mmadụ dị.

Na ntụnye nke ha n'ótù n'ótù, odeakwụkwọ izugbe steeti Anambra n'oge gara aga, ma bụrụkwa onye jiri aha otu ndọrọ-ndọrọ 'People's Democratic Party' wee zọọ ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ n'ahọ 2017, bụ Maazị Oseloka Ọbaze, na onyeisi Otu Sụbakwa Igbò, bụ Ọkammụta Pịta Ejiọfọ kwùru na ọ bụ naanị site n'ịkọwara na ịkụziri ụmụ na-eto eto ka ndị Ndị Igbo ga-enwe ike isi ichekwaba akụkọ ntọala na omenala ha ma mee ka o guzosie ike, ọbụnadị dịka o kwùrù na ụdị nkuzi ahụ e nyere bànyere ọjị bụ nke kwesiri ka a na-eme ya na mgbe na mgbe iji mee ka ụmụ na-eto eto mụta ma ghọta ihe a na-ekwu.

N'ozi ekele ya, onyeisi òtù ọrụ nhàzi nkuzi ahụ dị n'aka na mahadum ahụ, bụ Ọkammụta Richard Ụwakwe kèlèrè ndị dị iche iche bịara sonye na mmemme ahụ, ma rịọkwazie onye ọbụla n'ime ha ka o buru oziọma ahụ na ya bụ nkuzi wee bàá na mpaghara obodo ya dị iche iche, iji mee ka ya bụ mmụta gbasawanye.