Igbo sị na ọ na-abụ mgbe onye jiri teta, ọ bụrụ ụtụtụ ya, ma sịkwa na Ka ọ dị taa, ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ n'Achalla bụ isi obodo okpuru ọchịchị 'Awka North' nke steeti Anambra na nso-nso a, dịka ya bụ obodo merubèrè mmemme iri ji ọhụụ ya nke ahọ 2019.

Iri ji ọhụụ abụghịzị okwu ọhụụ na ntị nwa ọbụla gbara ahọ n'ala Igbo. Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị na-enye ya nkwọwa dị iche-iche ma na-ahụtakwa ya dịka nke ma ọ bụ nke ọzọ.

Iri ji ọhụụ bụ otu n'ime omenala dị iche iche e ji mara ndị Igbo n'ụwa gbaa gburu gburu. Ọ bụ mmemme omenahọ ma bụrụkwa nke ezi nwaafọ Igbo ọbụla na-esonyesi ike na ya.

More Articles ...

Page 1 of 2