Egwu bu onye amaghị agba, o kwebe n'isi. Ọ bụ ọtọpuru keleke isi. Egwu bụ ụda ọma a nụrụ na ntị ma bụrụkwa okwu ọnụ a gụrụ agụ, gbaa ya agbaa. Egwu bụ nri mkpụrụobi, ma bụrụkwa ọgwụ apa ime mmụọ. Ọ bụ ọgọdọ mkpuchi iwe, maka na egwu bata ọgbọ, ọnụma alakpuo ụra.

Ị mela were wetara anyị egwu Chief Stephen Osita Ọsadebe, ọ gụrụ maka Ome ife jide Ọfọ. Nke a na-akọwa n’asụsụ Igbo kajara akaja.

Jita Mazị Stephen Osita Ọsadebe na-agbawa isi. Egwu ya dị egwu!