Dịka a sị na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya ọ laba, ọ bụ nnọọ oge ntụgharị uche na oge iti aka n'obi, dịka e lìrì ozu oriakụ Josephine Nnenna Nwachukwu, bụ nne onyeisi ọchịchị obodo Ụkpọr.

Chi ewerela ehihie jie ụbọchị Wednezdee dịka ọkụ gbagburu otu nwaanyị na ụmụ ya abụọ n'Ọkịja dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala, na Anambra Steeti.

Akụkọ kọrọ na nwaanyị ahụ dị ime ọnwa atọ bụ nke ọkụ gbagburu na agaghị enwe ike ịchọpụta onye ọ bụ, ya na ụmụaka abụọ n'ime ụlọ ha dị na Umuoffor, Ọkịja.

Onye ahụ nwụrụ, Nwazuru Okeke, na ụmụ ya, Chidiebube na Makuochukwu, gbara afọ abụọ na otu afọ, bụ ndị nọ n'ime ogige ahụ oge ya bụ mkpamkpa kpara.

A nọrọ ụbọchị Satọdee wee lie ozu oriakụ Bessy Lilian Uzoaku Onwuamaegbu, bụ nne Ọka Ikpe ukwu steeti Anambra. Ya bụ mmemme akwamozu bụ nke weere ọnọdụ n'ezinaụlọ be di ya dị n'Isu, Oba, n'okpuru ọchịchị Idemili South nke steeti ahụ.

More Articles ...

Page 1 of 2