Ọkụ Ọkịja: Nwanyị Dị Ime na Ụmụaka Abụọ Anwụọla n'Anambra

Ezi na Ụlọ
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Chi ewerela ehihie jie ụbọchị Wednezdee dịka ọkụ gbagburu otu nwaanyị na ụmụ ya abụọ n'Ọkịja dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala, na Anambra Steeti.

Akụkọ kọrọ na nwaanyị ahụ dị ime ọnwa atọ bụ nke ọkụ gbagburu na agaghị enwe ike ịchọpụta onye ọ bụ, ya na ụmụaka abụọ n'ime ụlọ ha dị na Umuoffor, Ọkịja.

Onye ahụ nwụrụ, Nwazuru Okeke, na ụmụ ya, Chidiebube na Makuochukwu, gbara afọ abụọ na otu afọ, bụ ndị nọ n'ime ogige ahụ oge ya bụ mkpamkpa kpara.

Ọ bụ ihe sịrị ike nke a na-amaghị otu a ga-esi tinye aka na o nweghị onye azọpụtara n'ime ha dịka ọkụ ahụ nọ na-agha ike na-anwụ.

Ozi anyị nwetara gara n'ihu were kwuo, "Anyị enweghị ike bute ozu onye ọ bụla n'ime ha maka tupu anyị enwee ike bata n'ụlọ ahụ, ha abụrụgo ndị ọkụ gbagburu ha bụrụ ntụ."

Onye na-ahụ maka ezi mmekọrịta ndị uweojii na ọhaneze na steeti ahụ, Haruna Mohammed, kwuru na ya bụ akụkọ bụ ezie.

O kwuru na" ndị ahụ nwụrụ bụ ndị ọkụ gbara na o nweghị onye ga-amatazi ha."

"Ọkụ kpara mkpamkpa na Umuoffor, Ọkịja n'ogige otu nwoke aha ya bụ Maxwell Okeke."

"N'ihi nkea, nwunye ya dị ime bụ Nwazuru Okeke, ụmụaka abụọ, aha ha bụ Chidiebube Okeke, gbara afọ abụọ na Makuochukwu Okeke, gbara nanị otu afọ, bụ ndị nọ n'ime ụlọ ahụ oge mkpamkpa ahụ na-akpa bụrụzie ndị ọkụ gbara na o nweghị onye ga-ama onye ha bụ."

O kwuru n'ọkụ ahụ bụ nke a kwụsịrị oge ndị uweojii, ngalaba nke Ọkịja, wụchiri n'ogige site n'enyemaka nke ndị ọ metụrụ n'obi.

Mohammad onye kwuru na ihe kpatara ọkụ ahụ jiri bido bụ nke anamabeghị, tinyere na onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, Rabiu Ladodo, akpọọla ọkụ maka nyocha ka amata ihe kpatara ya bụ ọkụ maka na awọ anaghị agba ọsọ ehihie na nkịtị.