E Liela Ozu Oriakụ Ọnwụamaegbu n'Ọba

Ezi na Ụlọ
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

A nọrọ ụbọchị Satọdee wee lie ozu oriakụ Bessy Lilian Uzoaku Onwuamaegbu, bụ nne Ọka Ikpe ukwu steeti Anambra. Ya bụ mmemme akwamozu bụ nke weere ọnọdụ n'ezinaụlọ be di ya dị n'Isu, Oba, n'okpuru ọchịchị Idemili South nke steeti ahụ.

N'okwuchukwu n'ụlọ ụka 'St. John the Apostle Anglican Church', Ọbà, bụ ebe a nọrọ wee kàárá ya ụka onye nwụrụ anwụ, Bishọọpụ ụka Anglịkan na dayọsiisi Niger, bụ Rt. Rev. Owen Nwokolo kọwara ọnwụ dịka òkè onye ọbụla ga-éwèrịrị n'ụwa a, dịka o mere ka a mara na ọ bụ mgbe nke ahụ gachaara ka ikpe ga-esochi.

O jiri ndụ na akparamagwa Dọrcas nke akwụkwọ nso wee kọwaa ma tụnyere ezi ndụ oriakụ Ọnwụamaegbu, bụ onye ọ kọwara dịka onye bara úrù nke ukwuu n'ọrụ Chineke, n'ọrụ ụlọ ụka na n'ọrụ obi ebere, bụ inyerịtara ụmụ mmadụ aka, mgbe ọ dị ndụ, wee rukwaa ụbọchị ọnwụ ya.

Ọ kpọkuzịrị onye ọbụla dị ndụ ka o were ndụ ya na oge o nwere ugbua fèé Chineke òfùfè, nyere ndị nọ na mkpà aka, ma kwadokwara onwe ya ọnọdụ n'alaeze eluigwe maka ụbọchị ikpeazụ, bụ ụbọchị a ga-enye onye ọbụla ụgwọ ọrụ dịka ọrụ ya sìrì dị.

N'okwu nke ya na ya bụ akwamozu, aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ kọwàrà ya bụ agụ nwaanyị dịka onye biri ezi ndụ n'ụwa, ma meputakwa ọtụtụ ezi ihe kwesiri nñòmí n'ezinụlọ, n'ụlụ ụka na n'obodo.

Ọ kasizịrị ụmụ ya obi ka ha dìbé, ma dụọ ha ka jìgídesie ụkpụrụ nne ha ma sonyesie nzọ ụkwụ ya ike, ọbụnadị dịka o kwere nkwà ịga n'ihu n'ọrụ ọma dị iche iche o ji n'aka na steeti ahụ na iwètara ndị Anambra ezi ọchịchị.

Dịka ọ na-akọwa nne ya dịka nwaanyị obi ọma, onye ji ọkwa dịka ọkaikpe ukwu steeti Anambra, bụ ọkaikpe Ijem Onwuamaegbu rụtụrụ aka n'ụzọ dị iche iche nne ya sigoro gosi na ya bụ nne nke okwukwe, nwaanyị obi ọma na onye ọrụ Chineke na inyere ụmụ mmadụ aka na-echu ụra, ma kwupùta na ya nwere ezi olile anya na ntụkwasịobi na mkpụrụ obi ya nọ n'alaeze eluigwe ugbua na-ézù ike.

O kèlèrè ndị dị iche iche bịara isonye na ya bụ mmemme akwamozu na ndị tụnyere ụtụ ma ọ bụ nye aka n'otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ iji hụ na ya bụ akwamozu gara nke ọma, ma kwuo na óbì ga na-atọ nne ha ụtọ nke ukwuu n'ebe ọbụla ọ nọ n'ihi ọbịbịa ha, ma kpekwazie ka Chineke gaa n'ihu ịkwụghàchì ha mmaji kwùrù mmaji.

Ndị dị iche iche sonyere na ya bụ mmemme akwamozu gụnyèrè:

Minista ala anyị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi, bụ maazị Godffery Onyeama; Major General Azubuike Ihejirika lagoro ezumike nka; aka abụọ chịbụrụ steeti Anambra n'oge gara aga, bụ maazị Peter Obi na oriakụ Virgy Etiaba; kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ, bụ maazị Marcel Ifejiọfọr; onyeisi ndị ọrụ nyere gọvanọ Willie Obianọ, bụ maazị Primus Ọdịlị; ode akwụkwọ ìzùgbe steeti ahụ n'oge gara aga, bụ maazị Oseloka Ọbaze; Archbishọọpụ Province nke Niger n'oge gara aga, bụ 'Most. Rev'd.' M.S.C. Anịkwenwa; Bishọọpụ ụka Anglịkan na dayọsiisi Amichi, bụ 'Rt. Rev'd'. Ephraim Ikeakọr; nkè dayọsiisi Asaba, bụ 'Rt. Rev'd'. Justus N. Mọgekwu; nke Dayọsiisi Niger West, bụ 'Rt. Rev'd'. J.N. Ekwe; nke dayọsiisi Ọgbaru, bụ 'Rt. Rev'd' Prosper Amah; tinye ọtụtụ ndị ọrụ ikpe na ndị ọzọ selitere isi na ngalaba dị iche iche n'ala anyị.

Oriakụ Lilian Ụzọakụ Ọnwụamaegbu bụ onye a mụrụ n'abalị atọ nke ọnwa Ọkụtoobà ahọ 1928, ma nwụọ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Febụwarị ahọ a, ka ọ gbachara ahọ iri iteghete.

Di ya, bụ maazị Moses Ọbụmneme Ọnwụamaegbu lagoro mmụọ jiri ọkwa dịka Attorney General na Kọmishọna ikpe nkwụmọtọ nke mpaghara East Central ala anyị n'oge gara aga, ma jiekwa ọkwa dịka ọkaikpe nke ụlọikpe ukwu steeti Anambra n'oge gara aga.

Tupu ọnwụ ya, Oriakụ Ọnwụamaegbu nwere ụmụ ise, ụmụ-ụmụ iri na ụmụ-ụmụ-ụmụ abụọ.