Aka Akparala Otú Nwoke Tigburu Nwunye Ya

Ezi na Ụlọ
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ndị Uwe Ojii Ngalaba nke Steeti Naíjà anwụchịkọla Umar Tambari gbara afọ iri atọ maka itigbu nwunye ya, Hauwa, o were bụrụ onye nwụrụ anwụ maka nnupụisi.

Nkea mere ka ụbọchị ọnwa Febrụwarị gbara mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na isii, n'afọ puku abụọ na iteghete, n'ime obodo Emiworo nke dị n'okpuru ọchịchị ime ime obodo Wushishi na steeti ahụ, ka ha abụọ enweghị ike were nwee nkwekọrịta.

Onye ahụ a na-enyo enyo bụ nke ndị ọlụ uwe ojii na-alụ ọlụ na Ngalaba Wushishi nwụchịkọrọ ka ha nwetachara ozi.

Akụkọ kọrọ ụbọchị Tuzdee na nwa amadị a na-enyo enyo gwara nwunye ya lagoro mmụọ ka o kutere ya mmiri ọ ga-eji wee saa ahụ mana ya (nwunye ya) gbara isi akwara.

Akụkọ gara n'ihu were kwuo na nwoke ahụ gara jiri aka ya kute mmiri n'onwe ya ebe nwunye ya tụgharịziri bowe ya ebubo na o buru mmiri nke ya (nwunye ya) kutere.

Onye ahụ a na-enyo enyo jiri iwe na ọnụma nke juru ya obi were tie Hauwa étí étí nke buteziri ọnwụ ya.

Onye ahụ a na-enyo, oge ọ na-aza ajụjụ ọnụ boro nwunye ya ebubo ị leda ya anya.

Onye na-ahụ maka ezi mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, Mohammad Abubakar, kwuru na ya bụ ihe bụ eziokwu ma kwukwa na onye ahụ a na-enyo enyo ekwetala n'ebubo ahụ eboro ya.

Abubakar kwuru na Tambari jiri osisi were kụọ nwunye ihe ugboro ugboro, ebe nwanyị ahụ bụzi onye nwụrụ oge ebu ya aga n'ụlọ ọgwụ ma tinyekwa na a kpụpụla nwa amadị ahụ n'ụlọ ikpe.