Mba Kanada amawaputago nde dola 5 maka ikwado ntuli aka nke 2015 na Nigeria

Gọọmenti mba Kanada ewubego atụmatụ ịmawapụta nde dọla ise maka ịkwado ntụli aka elu nke ịhọpụta onye isi ala, nke a ga-eme n’ala Nigeria n’afọ 2015.

Onye nnọchite anya mba Kanada na Nigeria, bụ Mazị Chris Cooter, gwara ndị nta akụkọ n’ụbọchị ụka, na Benin, na Steeti Edo, na mba Kanada nwere nchekwube na ntụli aka nke afọ 2015 ga-aga ọfụma.

Mazị Cooter gbakwụnyere na mba Kanada nwere afọ ojuju maka otu ndị INEC siri hazi ntụli aka nke e mere na 2011. O kwuru na Kanada na-atụ anya na Nigeria ga-eme ọfụma karịa na-afọ 2015. Lee ihe Mazị Cooter kwuru na bekee:

"We will be working with Prof. Attahiru Jega and INEC very closely to promote democracy in Nigeria."

“Anyị na Ọkammụta Attahiru Jega na ndị INEC ga-arụkọrịta ọrụ ịme ka ọchịchị onye kwuo uche ya kwụrụ chịm na Nigeria”

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2017 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by WEBSITE PLAZA.