Ndị agha mba Ijipt hụrụ mpempe ụgbọ elu ahụ kpọkasịrị n’oshimiri Mediterenịan

Ndị agha mba Ijipt ekwuola na a hụrụ mpempe ụgbọ elu ahụ kpọkasịrị n’oshimiri Mediterenịan.

Onye okwuchite ọnụ ndị agha mba Ijipt kwuru na a hụrụ mpempe ụgbọ elu ahụ na ngwongwo ndị mmadụ nọ n’ụgbọ elu ahụ na maịlị otu narị na iri asatọ na Alegzandrịa.

N’ozi ya, onye mba Ijipt, bụ Abdel Fattah al-Sisi, kwuru na ihe mberede ahụ dị ezigbo nwute.

Ode akwụkwọ mba Amerịka, bụ John Kerry, kwuru na o chere na ọ bụ agha iyi egwu butere ihe mberede ụgbọ elu ahụ.

Ka o sina dị, a ka na-achọkwa ụgbọ elu ahụ bụ EgyptAir kpọkasịrị na Mediterenịan.

Ndị agha mba Gris, Ijipt, France na Briten sonyere n’ịchọ ụgbọ elu ahụ n’ikpere mmiri Kapatọs dị n’akụkụ mba Gris.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.