Ndi agha ofe n’elu nke ala Nigeria atụọla ogbunigwe na Port-Harcourt

Ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi Channels Television wetere akụkọ na ndị agha ofe n’elu nke ala Nigeria, bụ ndị a na-akpọ Nigerian Air Force na bekee atụọla mgbọ ogbunigwe na mpaghara Woji na Port-Harcourt. Anyị nwetere ozi na nke a bụ ihe ọghọm, n’ihi na otu ụgbọ elu ha luhapụrụ ogbunigwe ahụ n’akpasaghị anya.

Indabawa gbakwụnyere na ogbunigwe ahụ mebiri nanị otu ụlọ a na-arụchabeghị. Enwebeghị onye nwụrụ n’ihi nke a. Mana ezigbo ụjọ ji ndị bi na mpaghara ahụ.

Ihe ọghọm a mere n’isi ụtụtụ taa bụ Fraịdee. Onye Kọmishọna ndị uwe oji na Steeti Rivers, bụ Mohammed Indabawa, gwara ndị nta akụkọ na ogbunigwe ahụ a tụrụ bụ ihe ọghọm. Ndị agha ofe n’elu akpasaghị aka n’anya were tụ ya.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.

Please Support Igbo Radio Today

CLICK HERE TO DONATE

AFFORDABLE WEB HOSTING

nigeria 2840922 640

Transfer Today & Save

50%

Click Here