Ọgbakọ ndị Igbo n’Abuja na-ekele Ike C. Ibe

Ọgbakọ ụmụ afọ Igbo bi n’Abuja eburuna ọkpa ekele bunye Barịsta Ike C. Ibe. Ndị Igbo n’Abuja na-ekele Ike C. Ibe maka otu o siri chị ọgbakọ ndị Igbo ahụ n’Abuja, malite n’afọ 2013 ruo n’afọ 2014. Ike C. Ibe chịrị ndị Igbo n’Abuja dịka onye isi oche ha tupu ọ malite ịzọ ọkwa onye gọvanọ na Steeti Imo.

Na ntụli aka nke a na-akwado ime n’ọnwa Eprel maka ịhọpụta aka ga-achị Steeti Imo, Ike C. Ibe na onye ogbo ya bụ Emmanuel Iheanachọ ji aha ndị otu APGA azọ ọkwa.

N’ozi o weputere site na Facebook ya, Ike C. Ibe kwuru sị na e nweghị ịhe na-enye ọn̄ụ karịa mgbe ndị obodo mmadụ gbakọtara bunye ya ekele maka otu o siri jere ha ozi. Ike C. Ibe kwuru n’afọ juru ya maka na ndị Imo, ma nwata ma okenye, ma nwoke ma nwanyị na-eto ya maka otu o siri gara ha ozi.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2017 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by WEBSITE PLAZA.