Ọnwụ egbuole ikemba ndị Afrịka, Nelson Mandela

Nelson Mandela, onye ndị Afrịka niile ji eme ọnụ maka ịlụ nwere onwe anwụọla. Ọnwụ gburu ya taa n'obodo ya bụ Saụtụ Afrịka.

O nwere ike bụrụ na Ị maghị onye Mandela bụ. A mụrụ Mandela n'obodo Transkei, na Saụtụ Afrịka, n'abalị 18 nke ọnwa Julayị afọ 1918. Mandela bụ otu n'ime ndị a ma ama na ndị buru agha megide ọchịchị apataịdị na mba ahụ.

N'afọ 1962, gọọmenti mba Saụtụ Afrịka mara Mandela ikpe, tụọ ya nga mkpụrụ ọka. A tọhapụrụ Mandela na nga n'afọ 1990. O mechara bụrụ onye isi ala mba Saụtụ Afrịka n'afọ 1994. Ọ chịrị obodo ya bụ Saụtụ Afrịka malite n'afọ 1994 ruo n'afọ 1999.

Taa ka Mandela nwụrụ. Ọ gbara afọ 95 tupu ọnwụ egbuo ya.

Ụwa niile na-eru uju maka ọnwụ ide ji mba a. Ndị Saụtụ Afrịka, ndị matara Mandela dịka Mediba nọ n'uju ọnwụ. Ọtụtụ na-enwe aṅụrị maka ezigbo ndụ Mandela biri.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2017 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by WEBSITE PLAZA.