Top Stories

Grid List

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ n'okpuru ọchịchị Orumba South, dịka Ọhaneze Ndị Igbo gùzòbèrè ndị ndu ngalaba ya bụ òtù n'okpuru ọchịchị 'Orumba South' nke steeti Anambra. Ya bụ nnukwu mmemme nguzobe bụ nke dọtara ọtụtụ ndị eze ọdịnala obodo dị iche na steeti ahụ, tinyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị ndu obodo ọtụtụ ndị ọzọ okwu ha nà-ada ụda na ya bụ steeti.

Igbo sị na ọ na-abụ a kpaa akpaa, a rahụọ n'ute, ma sịkwa na ọ na-abụ a dị n'ìzù a nata ndị mmụọ ihe. Ụlọ ọrụ ahụ okwu bànyere oke ala dị n'aka n'ala Nigeria, bụ 'National Boundary Commission (NBC)' agbapeela amụmà ọrụ ịkpa ókè àlà anya ọzọ na nsogbu oke ala ahụ na-adapụta n'etiti ụfọdụ obodo steeti Anambra na steeeti Enugu, n'ebe steeti abụọ ahụ gbàrà agbataobi, iji hụ na e kpèzìrì ya ma mekwa ka ufo tọrọ àtọ laghachi.

Opekampe ụmụ na-eto eto dị puku iri n'ọnụ ọgụgụ kwa steeti ọ bụla n'ala ànyị Naijiria bụ ndị Ụlọakụ Etiti ga-etinye n'ọrụ ugbo iji were hụ na nri bụ atụrụ tawazie n'ala anyị ma sitekwa na ya mee ka ọrụ dịkwa.

Igbo sị na ọ bụ ka onye si eme ka oku si akpọ ya, ma sịkwa na ùgwù dike anaghị agha ya, ma na ndụ ma n'ọnwụ. Ka ọ dị taa, a kọwaala otu onye edemede a mà amá, bụ ọkammụta Chịnua Achebe lagoro mmụọ dịka odogwu nwoke ọka ibe, na onye nwere ezi ọhụhụ ụzọ.

Oke ọñụ dara n'ogige ụlọ ahụike Obu Ọzọm dị n'Urunnebo nke obodo Enugwu-Ukwu dị n'okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra, dịka gọọmenti steeti ahụ gbàpùrù mmiri ọhụụ, bụ nke ji ọkụ si n'ikike anyanwụ were arụ ọrụ, ma nyefee ya n'aka ụlọ ahụike ntà ahụ.

Gọọmenti etiti, site n'okpuru ngalaba ụlọ ọrụ ya na-ahụ maka imezigharị na ichekwaba okporo ụzọ, bụ 'Federal Road Maintenance Agency (FERMA)' amalitela idozigharịsị ụfọdụ ụzọ mebiri emebi na mpaghara ebe dị iche iche na steeti Anambra.

Ugo Ukwu nke Naijiria nọrọ n'amaegwuregwu Godswill Akpabio dị na Uyo were gosi Uze Benin na ha ka na-amụ amụ n'ebe egwu bọọlụ dị. Ugo Ukwu jiri ọkpụ abụọ asatara nanị otu were merie Uze na asọmpi nke otu L maka ntozu nke iko Afrịka.

Dịka ọ na-ahịọ na mba Ijipt ebe AFCON ndị erubeghị afọ iri abụọ na atọ na-aga n'ihu ugbua, Naijiria jiri iwe were gosi mba Zambia na ọ bụ iti na-ama ụzọ akwụkwọ ka ha jiri ọkpụ atọ asatara otu si ha jido n'amaegwuregwu Al Salam na Cairo.

Dịka asọmpi maka ntozu AFCON na-ebiri ọkụ, otú egwu bọọlụ ala anyị, Ugo Ukwu, bụ ndị a na-eche na ha ga-ezukọta na Naijiria, ụbọchị taa bụ Mọndee iji were kwado maka asọmpi a iji sonye na AFCON 2021. Asọmpi mbụ nke otu B dị n'etiti Naijiria na ndị mba Benin Republic.

Ámá egwuregwu Al Salam dị na Cairo mba Ijipt - bụ ebe ndị otu egwu bọọlụ Naijiria, Ugo Kara aka, nọrọ merie mba Tunisia were mabute Ọla nchara na 2019 AFCON - bụ ebe anọrọ malite egwu bọọlụ ndị otu B nke dị n'etiti ndị ji ya bụ Iko, Naijiria na ogbo ha Ivory Coast, dịka onye ọ bụla na-azọ ịsonye na Iko Olympic na 2020.

Naijiria jiri ọkpụ anọ asataghị ma chaa were si ndị ọgbọ ha si mba Qatar nnọọ dịka ha sọrọ mpi mbụ ha na Iko Mba Ụwa FIFA ndị na-erughị afọ iri abụọ na mba Poland.

N'agbanyeghị ohere niile ha nwere, Naijiria gbara aka ihe olu lata dịka egwuregwu ndị na-erubeghị afọ iri na asaa na mba Afrịka bịara n'isi njedebe tata na Tanzania. Naijiria ka ndị Angola jiri ọkpụ abụọ asatara nanị otu were merie dịka mba abụọ a zọrọ ndị nke atọ na Satọdee. N'agbanyeghị mmeri a, Ugo Ọlaedo Naijiria ga-esonye na nke mba ụwa niile na Brazil.

Igbo sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị, ma sịkwa na ọ na-abụ a na-egbu ji awaị, ọ na-atọ ụtọ, a na-abachawanye ji. Ka ọ dị taa, ndị uwe ojii steeti Anambra akpụgharịala ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị omekoome, dị iri asaa na otu n'ọnụ ọgụgụ, bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Mkpu akwa dàrànnọọ n'obodo Ụmụokpu dị n'ikpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra, dịka ọkụ ọgbụgba dabìdòrò ma gbaa otu nnukwu ụlọ pịa-pịa. Ya bụ oke ọkụ bụ nke a na-enyo ènyò na ọ bụ nsogbu sitere n'ọkụ latiriiki kpàtàrà ya, ma bụrụkwa nke gbara ya bụ ụlọ gwòògwòò, tinyere ọtụtụ ngwongwo dị n'me ya, nke gbúru nde kwùru nde Naịra.

Igbo sị na ọ na-adị mma a gbaa bute, a kwachie, chere ọzọ; ma sịkwa na a naghị aka àkà eje nta agwọ, kama na ọ bụ agwọ pụta, a chụba ya.

N'ịgbaso okwu Igbo ahụ sị na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja, a dụọla ma kpọkuo ndị ntorobịa na steeti Anambra ka ha sonye n'amụma ịkwalite ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ na steeti ahụ.

Òtu ahụ jikọtara ndị ọrụ nchekwa dị iche-iche na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka 'Anambra State Security Council' adụọla ụmụafọ steeti ahụ ka ha ghara ịtụ egwù n'ịbata ụlọ maka nzukọ ọnwa Ọgọstụ ahọ a, n'ihi na egwu ọbụla adịghị.

Ndị uwe ojii steeti Anambra anwụchikọọla mmadụ ise kpara nkàta wee jiri egbè pụnara otu nwa amadi bụ maazị Nzube Udegbu ụgbọala Toyota Camry ya n'Ọnịtsha, n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ a.

Top Stories

Grid List

N'ịgba mbọ ya iji were memilaa ọgwụ adịgboroja n'ala anyị maka na ọ bụrụ na agbaghị ụzọ owere mgba, ọ naghị echi, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi nri na ọgwụ n'ala anyị a na-akpọ NAFDAC na mkpirisi, Ọkammụta Mojisola Adeyeye, ekwuola na ụlọọrụ ahụ emebiela ọgwụ adịgboroja karịrị ijeri naira atọ n'afọ abụọ gara aga. Adeyeye mere ka amata nkea na mkparịtaụka ya na ndị nta akụkọ n'Abuja ụbọchị Mọndee.

Gọọmenti Etiti nọrọ ụbọchị Wednezdee kwupụta ebumnobi ya iwe mmadụ puku iri asaa na ise n'ọrụ ugbo iji were tute mmụọ ndị ọrụ ugbo n'ịkọpụta nri. N'otu aka ahụ, o kewapụtakwara Otu Nzukọ maka Azụ nke Naijiria, nke nwere ebumnuche ịkwalite ịzụ azụ n'ala anyị dịka Naijiria mechiri oké ala ya niile n'ebe ịtụbata azụ n'ala anyị.

Ndị obodo Ojoto dị n'okpuru ọchịchị 'Idemili South' agbapeela okporo ụzọ ọhụụ ha rụrụ, bụ nke na-azabụ okporo ụzọ St. Barnabas, ma bàgharịzie ya aha ka ọ bụrụzie okporo ụzọ "Eze Oranyelu''.

Òtù jikọtara ụmụafọ steeti Anambra bi n'Abụja, bụ nke a kpọrọ "Anambra Town’s Peoples Association, Abụja (ASTPA)" emerùbela ụbọchị omenala Igbo nke ahọ 2019. Oke mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'Abụja, bụ isi obodo ala Nigeria dọtara ndị sitere obodo dị iche iche na steeti Anambra bi n'Abụja nakwa mba ofesi, tinyere aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ.