19
Sat, Oct
23 New Articles

Top Stories

Grid List

Mick Mulvaney, otu n'ime ndị ọkwa ha gbagoro agbago na White House, obi gọọmenti mba Amerịka, atabiena ire taa. Ọ tọghere ngịga n'igbudu ahịa. Mgbe Mulvaney na-agwa ndị nta akụkọ okwu na Wọshingtịn, n'ụbọchị Tọzdee, mgbe ọ na-aza ajụjụ, Mulvaney kwetere na ịhe Prezidenti Trump jiri hapụ ịnye ndị Yukren $400 M (narị ijeri dọla anọ) ndị omebe iwu mawapụtara ha bụ iji mee ka Yukren mere ya ihe ahụ ọ chọrọ.

Onye nnọchite anya ndị Baltimore n’ụlọ nzukọ omebe iwu mba Amerịka, bụ Maazị Elaịja Commings, anwụọla. Nwa amadị ahụ nwụrụ n’isi ụtụtụ taa bụ Tọzdee, n’ụlọ ọgwụ John Hopkins, site n’ahụ mgbu nke O nwere kemgbe.

Anyammiri gbara ka íju ụnyaahụ na mpaghara ebe dị iche iche n'Ọnịtsha dị na steeti Anambra, dịka otu nnukwu ụgbọ òlòko bu mmanụ ụgbọala darà wee gbagwòó, binwurukwa ọkụ ma gbaa ọtụtụ ebe na ọtụtụ ihe pịa pịa.

A kọwaala mkpà ọ dị ịkwàlite ụmụaka nwaanyị ịgụ akwụkwọ nke ọma, ma kpọkwa òkù ka e bèlata otu e si emekpà ụmụaka nwaanyị ahụ na otu e si akpchapụkwa ha n'akụkụ.

Igbo sị na ihe ji ọrụ bụ mmàlite na íké ọrụ, ma sịkwazie na ihe nara ọrụ bụ ọrụ. Ka ọ dị taa, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwuola na a ga-arụcha ụlọ ezumeezu ogoogo mba ụwà ahụ a na-arụ n'Awka, n'ime ọnwa Epurè ahọ na-abịa abịa.

Flying mechanical involve mold

Afrịka

N'ihi ajọ ọnọdụ mbize ahụ na-ebi obodo dị iche iche aka ọjọọ ma na-emekwa mkpamkpa na mpaghara ebe dị iche iche na steeti Anambra; gọọmenti etiti ekwela nkwà ịgbatara steeti ahụ ọsọ enyemaka aka ọkụ aka ọkụ n'ebe dị iche iche mbize na-enye nsogbu.

Naijiria jiri ọkpụ anọ asataghị ma chaa were si ndị ọgbọ ha si mba Qatar nnọọ dịka ha sọrọ mpi mbụ ha na Iko Mba Ụwa FIFA ndị na-erughị afọ iri abụọ na mba Poland.

N'agbanyeghị ohere niile ha nwere, Naijiria gbara aka ihe olu lata dịka egwuregwu ndị na-erubeghị afọ iri na asaa na mba Afrịka bịara n'isi njedebe tata na Tanzania. Naijiria ka ndị Angola jiri ọkpụ abụọ asatara nanị otu were merie dịka mba abụọ a zọrọ ndị nke atọ na Satọdee. N'agbanyeghị mmeri a, Ugo Ọlaedo Naijiria ga-esonye na nke mba ụwa niile na Brazil.

Mba Guinea na Naijiria lụrụ ọgụ ka nwoke n'ime nkeji iri na iteghete na asọmpi mbụ nke na-eso nke ikpeazụ n'egwuregwu Iko Mba Afrịka na-aga n'ihu na Tanzania. Nkea butere penariti dị ogologo nke kwụsịrị oge Ogaga Oduko gbaliri nke ya n'eluigwe mere ka Syli Nationale nke Obere gaa n'ihu na-agbata nke ikpeazụ ụbọchị ụka n'agba nke iri na atọ egwuregwu ahụ.

Ndị Naịjirịa nọrọ n'amaegwuregwu Chamazi dị na Dar es Salaam ụbọchị Satọdee were bụrụ ndị mbụ n'otú ha na asọmpi ụmụ okorobịa n'erubeghị afọ iri na asaa nke mba Afrịka na-aga n'ihu dịka ha na ndị ọgbọ ha si mba Uganda nyere onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ.

Onye na-agba n'ihu bụ Olakunle Olusegun kpara ike dịka dike oge otu egwu bọọlụ ala anyị na-erubeghị afọ iri na asaa nọrọ n'ụbọchị Wednezdee bụrụ mba mbụ ga-esi Afrịka were sonye Asọmpi Iko FIFA maka ndị na-erubeghị afọ iri na asaa nke afọ a.

Ebe enyi abụọ na-agba mba, ọ bụ ahịhịa bụ ihe na-ata ahụhụ. Nke a kọwara ihe mere ụbọchị ụka ka ndị otu egwu bọọlụ Naijiria na-erubeghị afọ iri na asaa nọrọ n'ámá egwuregwu Dar es Salaam were gosi ndị ọgbọ ha si Tanzania, bụ ndị anọ be ha asọ mpi ahụ, na bụ ọka ibe na agba nke iri na atọ Iko Mba Afrịka ndị na-erubeghị afọ iri na asaa.

Mkpu akwa dàrànnọọ n'obodo Ụmụokpu dị n'ikpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra, dịka ọkụ ọgbụgba dabìdòrò ma gbaa otu nnukwu ụlọ pịa-pịa. Ya bụ oke ọkụ bụ nke a na-enyo ènyò na ọ bụ nsogbu sitere n'ọkụ latiriiki kpàtàrà ya, ma bụrụkwa nke gbara ya bụ ụlọ gwòògwòò, tinyere ọtụtụ ngwongwo dị n'me ya, nke gbúru nde kwùru nde Naịra.

Igbo sị na ọ na-adị mma a gbaa bute, a kwachie, chere ọzọ; ma sịkwa na a naghị aka àkà eje nta agwọ, kama na ọ bụ agwọ pụta, a chụba ya.

N'ịgbaso okwu Igbo ahụ sị na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja, a dụọla ma kpọkuo ndị ntorobịa na steeti Anambra ka ha sonye n'amụma ịkwalite ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ na steeti ahụ.

Òtu ahụ jikọtara ndị ọrụ nchekwa dị iche-iche na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka 'Anambra State Security Council' adụọla ụmụafọ steeti ahụ ka ha ghara ịtụ egwù n'ịbata ụlọ maka nzukọ ọnwa Ọgọstụ ahọ a, n'ihi na egwu ọbụla adịghị.

Ndị uwe ojii steeti Anambra anwụchikọọla mmadụ ise kpara nkàta wee jiri egbè pụnara otu nwa amadi bụ maazị Nzube Udegbu ụgbọala Toyota Camry ya n'Ọnịtsha, n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ a.

Igbo sị na ọ na-abụ onye e nyèrè mara chịkwaa, e nyekwuo ya nke ka nkè. Ka ọ dị taa, aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ eduola oriakụ Ijem Ọnwụamaegbu n'ọrụ dịka ọkaikpe mkwụmọtọ steeti ahụ, na dịka nwaanyị mbụ na-eji ya bụ ọkwa. Oke mmemme idu n'iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, oge ndị isi ọchịchị steeti ahụ nwere nzukọ.

Top Stories

Grid List

Igbo sị na-abụ e too onye gburu ewu, ọ hụ ehi, o gbuo. N'ịgbaso nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ na nso-nso a wee nabata ndị nkuzi ahụ sitere steeti Anambra, bụ ndị nwetara nturu ugo dị iche iche n'asọmpi a chịkọbara na mmemme ncheta ụbọchị ndị nkuzi na mba ụwa, nke ahọ 2019, bụ nke a chịkọbara n'Abụja.

Ndị obodo Ojoto dị n'okpuru ọchịchị 'Idemili South' agbapeela okporo ụzọ ọhụụ ha rụrụ, bụ nke na-azabụ okporo ụzọ St. Barnabas, ma bàgharịzie ya aha ka ọ bụrụzie okporo ụzọ "Eze Oranyelu''.

Asụsụ bụ e jiri mara ndi ma bụrụkwa nkụ dị na mba na-eghere.mba nri. Ọ bụ ahụghị ebule ma sị elina dike n'ebe mkprịta ụka mmadụ na ibe ya dị. Asụsụ ihe mbụ mmadụ jiri karị ibe yan'elu ụwa.

N'ala Igbo, asụsụ bụ omenala; Asụsụ bụ ejiri mara Igbo; asụsụ bụ nwata tote o tokwuru; asụsụ bụkwazị ihe nketa, bụ nke sitere n'aka ndi nna nna anyị ha wee rute anyị aka. Onye amaghị asụsụ nọ ọdụ ka onye ọbara kọrọ n'isi, maka na asụsụ bụkwa ndụ. Ọzọkwa, onye enweghị asụsụ, aha ya efuona maka aha onye na-esite n'asụsụ onye.