INEC Ekewàpụtakwuola Ogige Atụmakwụkwọ Ọhụrụ n'Anambra

May 14, 2021 - 18:22
 0
INEC Ekewàpụtakwuola Ogige Atụmakwụkwọ Ọhụrụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ


Na nzọpụ ụkwụ ya iji mee ka atụmakwụkwọ dịwnyere ndị mmadụ mfe na nso, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọkwa ọchịchị n'ala Nigeria, a maara dịka 'Independent National Electoral Commission, INEC' (ngalaba steeti Anambra) ekewàpụtakwuola ogige ọhụrụ ebe a ga na-atụ akwụkwọ na steeti ahụ.

Mmemme nkwupụta banyere mkpebi a bụ nke ụlọọrụ ahụ chịkọbara na nsonso a, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra, ebe  ndị ọrụ gọọmentị, ndị nọchitere anya ụlọ omeiwu etiti na nke steeti, ndị nọchitere anya ndị ikedịnobi (ndị ọlụsị), ndị nnọchianya otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche, ndị ọrụ nchekwa na ọtụ dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù sònyèkwàrà na ya.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi ụlọọrụ INEC na steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkwàchukwu Ọrjị mere ka a mara na ebe ụfọdụ ogige ịtụ akwụkwọ dị na steeti ahụ mèrè ya ka ọ na-ahịa ndị mmadụ ahụ ịpụta ga tụọ akwụkwọ n'ihi na o teere ha aka; bụzị nke mere na ụfọdụ n'ime ha anaghịzị erite uru maọbụ na-emezupụta ikike dịịrị ha n'ịhọpụta onye ndu ha oge ọbụla a na-atụ akwụkwọ.

O kọwazịrị na ọ bụ n'ihi nke ahụ ka ha jiri kpebie ikewàpụta ogige ọhụrụ n'ebe ọ dịgasị mkpa, iji mee ka ọ dị ndị mmadụ nso ma mekwa ka ha na-esonyesi ike nke ọma na etu o kwesiri, n'ịtụ akwụkwọ.

Dịka o siri kọwaa, ọnụọgụgụ ogige ebe a na-atụ akwụkwọ na steeti ahụ ugbua (nke dị 4, 608) bụ nke e kewàpụtara kemgbe ihe ruru ahọ iri abụọ na ise (25) gara aga, ma kwuo na ụfọdụ ogige ahụ dịkwàzị n'ebe ekwesighị ekwesi, dịka ọnọdụ siri gbata kwụrụ taa, n'ihi na ụfọdụ n'ime ha dị n'ihu arụsị, n'ihu ụlọ mmadụ, n'ihu ụlọụka, na ebe ndị ọzọ ezighị ezi.

O kwuwàzịrị na ha na-ekewàpụtakwu ogige ọhụrụ 1,112 n'ọnụọgụgụ ọzọ iji wetazie mkpokọta ọnụọgụgụ ebe a na-atụ akwụkwọ na steeti ahụ ka ọ dịzie 5720. O nọkwazịrị ebe ahụ kwuwaa na ha ga-amalite ndebanye aha n'akwụkwọ na steeti ahụ maka ịgbata akwụkwọ ikike e ji atụ akwụkwọ màlite n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juunu ahọ a, ọbụladị dịka ọ kpọkùzịrị ndị mmadụ enwetèbeghị akwụkwọ ikeke ahụ ka ha sonyesie ike n'atụmatụ ndebanye aha ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Wille Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ odeakwụkwọ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ, tòrò ụlọọrụ INEC maka ịchịkọba mmemme ahụ na mkpebi ya ahụ ikewapụta ogige ọhụrụ na steeti ahụ, ma kwupụta olileanya o nwere na nke ahụ ga-enye aka n'ọtụtụ ụzọ pụrụ iche n'ịkwàlite usoro nhọpụta ọkwa ọchịchị na ịtụ akwụkwọ na steeti ahụ.

Dịka ọ na-adụ Ndị Anambra enwetabeghị akwụkwọ ikike e ji atụ akwụkwọ ọdụ ka ha sonyesie ike n'atụmatụ ndebànye aha ahụ INEC ga-amalite oge adịghị anya; Gọvanọ Obianọ gwàkwàzịrị ụlọọrụ INEC na ọ ga-adị mkpa ka ọ na-achịkọba ụdị ọmarịcha ọgbakọ dị etu ahụ na mgbe na mgbe, n'ihi na nke ahụ ga-enye aka ime ka ọhaneze sonye n'ihe a na-eme, ma kụzikwara ndị mmadụ ihe dị iche iche ha kwèsìrì ịma banyere atụmatụ nhọpụta ọkwa ọchịchị, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ kwàlite usoro ọchịchị onye kwuo uche ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484