Innoson Agbapeela Ngalaba Ọhụrụ, Ụgbọala Ọhụrụ Na Nnewi

Jul 15, 2021 - 19:41
Jul 15, 2021 - 19:45
 0
Innoson Agbapeela Ngalaba Ọhụrụ, Ụgbọala Ọhụrụ Na Nnewi


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ a na-egbu ji awaị, ọ na-atọ ụtọ, a na-abachawanye ji.

Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ a mà àma na-emepụta ụgbọala n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'Innoson Vehicle Manufacturing Company (IVM) ewepụtala ngalaba ụlọọrụ mmepụta ụdịrị ụgbọala ọhụrụ ọzọ, iji gbakwụnyekwuo n'ụdị ụgbọala ndị ọzọ ọ na-emepụta.

Mmemme ịgbape nke a bụ nke weere ọnọdụ n'Ụmụdim Nnewi dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi North' nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ; Minista na-ahụ maka ego nà amụmà ego ọrụ n'ala Nigeria, bụ Dọkịta Zainab Ahmed na ògbò ya nke na-ahụ maka ụlọọrụ, azụmahịa na iji ego achụ ego, bụ Otunba Adebayo, na ọtụtụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ.

E wezuga ngalaba mmepụta ụgbọala abụọ ahụ a gbapere ọhụrụ, a nọkwara na ya bụ mmemme gbapee ngalaba mmepụta akụrụngwa na-eme ka mmadụ e ji were agba ihe, bụ nke a kpọrọ 'Robotic Spraying Booth', nke ụlọọrụ innoson ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Obianọ, nke ọ bụ osote ya, bụ Dọkịta Nkem Okeke nọchitere anya ya gbàrà akaebe na ụlọọrụ innoson na-agawanye n'ihu dịka ụlọọrụ mmepụta ụgbọala a ma ama na mba Afrịka, ma gbakwa akaebe na ụlọọrụ ahụ atụnyela ụtụ n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche n'ịkwàlite ọnọdụ akụnụba ala Nigeria. 

O kwuru na ya bụ ụlọọrụ ekewàpụtala ọtụtụ ohere ọrụ nye ụmụafọ Nigeria na ndị mba ọzọ, kwàlite ọnụego na-abata n'akpà ego steeti ahụ na n'àkpà ego ala Nigeria, tinyekwaziere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ o sigoro kwàlite mmepe obodo, ọnọdụ obibindụ na ọnọdụ akụnụba. Ọ kpọkuzịrị gọọmenti etiti na gọọmenti steeti dị iche iche ka ha na-atụnyere ụlọọrụ ahụ site n'ịgba ya aka ahịa oge ọbụla ha nwere mkpà ụgbọala.

N'okwu nke ya oge e dugharịchara ha n'ime ụlọọrụ ahụ, Minista Ahmed kwuru n'eziokwu na ihe ọ hụrụ n'ebe ahụ tụrụ ya n'anya, kọwaa na ụlọọrụ ahụ bụ ọkaibe n'ime ụlọọrụ olenaole ndị ọzọ na-emepụta ụgbọala na Nigeria, ma tòkwazie onyeisi ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya maka agadaga ọrụ ha na-arụ ebe ahụ na ihe dị iche iche ha na-emepụta na ya bụ ụlọọrụ.

O kwuru na onyeisiala Nigeria bụ Muhammadu Buhari nwèrè mmasị pụrụ ichè na ọnụnụọkụ n'obi ịkwàlite ụlọọrụ mmepụta ngwaahịa dị iche iche dịgasị n'ala Nigeria, nà n'ịkwàlite ọnọdụ akụnụba ala Nigeria. O kelekwazịrị ụlọọrụ ahụ maka imepụtasị ụdị ụgbọala bụ ọpụrụiche na ejiamaatụ, ma kelekwazie gọọmenti steeti ahụ maka ime ka ụlọọrụ ahụ nwee ezi ọnọdụ dị larịị maka azụmahịa na arụmọrụ ya na steeti ahụ.

Na ntụnye nke ya, Minista Adebayo mèrè ka a mara na ụlọọrụ Innoson agbanyela mgbọrọgwụ nke ọma n'ihe gbasaara mmepụta ụgbọala, gbakwa akaebe na ya bụ ụlọọrụ enyela aka n'iwulite ùgwù dịịiri ala Nigeria n'anya mba ụwa, ọbụladị dịka o kwere nkwà na gọọmenti etiti ga-aga n'ihu inye ụlọọrụ ahụ nkwado etu o kwesiri na oge ọbụla ọ chọrọ nkwàdo ya. 

N'akụkụ nke ya, onyeisioche otu jikọtara ndị na-emepụta ụgbọala n'ala Nigeria a maara dịka 'National Automotive Design and Development Council (NADDC)', bụ Sinetọ Osita Izunaso kwuru na ọ bịara n'ebe ahụ ka o jirikwa anya ya wee hụ. O kwuru na ụlọọrụ ahụ na-emewanye nke ọma, ma kpọkuzie onyeisi ụlọọrụ ahụ ka o bịa soro gosipụta ụgbọala ya na mmemme azụmahịa ngosipụta ụgbọala e mepụtasịrị n'ala Nigeria a maara dịka 'Made-in-Nigeria Vehicles Trade Fair', nke ahọ a na-abịa n'ihu, bụ nke a ga-eme n'ọnwa Ọktoba ahọ a.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya n'ebe ahụ, onyeisi ụlọọrụ IVM, bụ Maazị Innocent Chukwuma kèlèrè gọọmenti steeti Anambra na nke etiti maka nkwàdo ha nye ụlọọrụ ya na ụlọ mmepụta ngwaahịa ndị ọzọ, ọkachasị site n'inye ha ezi ọnọdụ azụmahịa bụ ịgbà, ya na ịgba ha aka ahịa.

O mere ka a mara na ụgbọala a ga na-emepụta na ngalaba ụlọọrụ ahụ bụ ụgbọala 'Innoson Shuttle' bụ ụgbọala shọtụụl ga na-ebu mmadụ asaa; ngalaba ụlọọrụ 'Innoson Connect' bụ ebe a ga na-emepụta ụdị ụgbọala ọhụrụ dị iche iche ga-adị ọnụ ala, anaghị añụ mmanụ ọkụ nke ukwuu, ma dịkwa mfe ndozi; ya na akụrụngwa 'Automated Robotic Spraying Booth' bụ ụdị nke mbụ na mbụ e nwegoro n'ala Nigeria.

O mere ka a mara na ụlọọrụ ahụ ga-ewe ego ruru ijeri naịra anọ na ụma isii (N4.6bn), kpọpụtasịa ọtụtụ uru dị iche iche ọ ga-aba na etu ọ ga-esi kwàlite ọnọdụ akụnụba, ma kwuo na ọ ga-ekewàpụtara narị kwuru narị ndị ntorobịa ọtụtụ ohere ọrụ, tinyere ọtụtụ ụzọ ọ ga-esi nye aka n'ịkwalite ọnọdụ obibindụ na ọnọdụ akụnụba. 

Ọtụtụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyere onyeisi òtù jikọtara ndị na-emepụta ngwaahịa n'ala Nigeria bụ 'Manufacturers Association of Nigeria (MAN)', Injinia Mansur Ahmed; onyeisi ụlọọrụ 'Bank of Industry', bụ Maazị Olukayode Pitan; onyeisi ụlọọrụ NADDC, bụ Injinia Aliyu Jelani; gọvanọ chịbụrụ steeti Anambra n'oge mbụ, bụ Dame Virgy Etiaba; tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484