JDPC Ekesàárálá Ndị Ihe Na-Esiri Ike Nri n'Ọnịtsha

Oct 21, 2020 - 23:04
Jan 28, 2021 - 23:05
 0
JDPC Ekesàárálá Ndị Ihe Na-Esiri Ike Nri n'Ọnịtsha

Izunna Okafor

Òtù a maara dịka 'Justice Development and Peace Commission (JDPC)' nọrọ na nsonso a wee kesàárá ndị dị iche iche ụwa na-atụ n'ọnụ nri na ihe oriri ndị ọzọ dị iche iche iche.

Nke a bụ n'iji merubè ụbọchị nri na mba ụwa nke ahọ a bụ 2020, ma bụrụkwa nke e mere n'Ọnịtsha, na steeti Anambra.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi JDPC na Achdayọsisi nke Ọnịtsha, bụ Ụkọchukwu Edwin Udoye kọwàra nri dịka ihe dị oke mkpà na ndụ mmadụ ọbụla, maka na mmadụ chọrọ nri iji dị ndụ ma nwekwa ike ime ihe.

Ọ gbarụrụ ihu ma kwaa arịrị na ọtụtụ ụmụafọ Nigeria enweghịzị nri oriri ugbua, ebe ọtụtụ n'ime ha bụkwa ndị ihe na-esiri ike n'ihi etu ọnọdụ akụnụba ala Nigeria siri dobe imi na ọnụ ugbua, ya na etu ọnụahịa nri na ihe ndị ọzọ siri dịzie oke elu ugbua, nke na ọ bụzịkwa naanị ndị ọgaranya nwekwara ike ịzụtanwu nri ugbua.

O mere ka a mara na Achdayọsisi Ọnịtsha na-atụ anya ịzụ mmadụ karịrị puku abụọ na narị abụọ n'ọnụọgụgụ nri n'ime mpaghara anọ dị n'Achdayọsisi. O kelekwazịrị Achbishọọpụ Valerian Okeke maka mbọ dị iche iche ọ gbara n'ibelata ihe isi ike ndị mmadụ na-agabiga, ọkachasị mgbe ahụ ọrịa korona kechiri ihe niile, nakwa ugbua o ji nwayọ agbadata.

O mere ka a mara na òtù ahụ sonyèèrè mba ụwa na mmemme ahụ nke ahọ a, ma kwuo na nke ahụ bụ nke mbụ ha na-esonye n'imerùbè ya bụ mmemme n'ụzọ dị etu ahụ.  O kwuru na nke ahụ ga-enye aka ịkwàlite ezi ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ ma mekwa ka ndị enweghị ihe oriri nwee ihe ha ga-eri. Ọ gara n'ihu kwuo na nke ahụ so n'ebumnobi e jiri guzobe òtù JDPC, bụ ime ka ihe dịrị ndị ụwa na-atụ n'ọnụ mma.

Ndị dị iche iche soro keta òkè n'ihe ahụ e kesàrà, kèlèrè òtù ahụ na ndị tụpụtara ọmarịcha atụmatụ ahụ, ma kpee ka Chineke gọzie ha.

Mmemme ụbọchị nri na mba ụwa bụ ụbọchị pụrụ iche òtù mba ụwa 'United Nations' guzobere n'ahọ 1945 iji merùbe nri, kọwaara ndị mmadụ ihe ha kwesiri ịma maka ya,  ma tụgharịkwa uchè banyere etu a pụrụ isi mee ka ụmụ mmadụ nwee nri gbaanyụụ. A na-emerùbe mmemme ahụ n'ụbọchị iri na isii ọnwa Ọkụtooba ahọ ọbụla.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.