Justin Trudeau na Ndi otu Libral Pati Enwena Mmeri na Kanada

Justin Trudeau na Ndi otu Libral Pati Enwena Mmeri na Kanada

Oct 22, 2019 - 18:16
Jan 19, 2021 - 18:16
 0
Justin Trudeau na Ndi otu Libral Pati Enwena Mmeri na Kanada
: :
playing

Mba Kanada eweghachina onye Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Justin Trudeau n’ọkwa ọchịchị. Trudeau nwetere mmeri dịka onye isi ala mba Kanada na ntụli aka ozuru-igbo nke e mere na mba ahụ ụnya bụ abalị 21 nke ọnwa Ọkụtoba.

Mba Kanada bụ otu n’ime mba ndị nwere usoro ọchịchị palịamentrị. Nke a pụtara na e kewara mba ahụ n’ọtụtụ ọnụmara nnọchite anya gọọmenti dị ịche ịche. A na-eme ntụli aka ozuru oha, ọnụmara ọbụna na-ahọpụta otu onye maka ịnọchite anya ha n’ụlọ omebe iwu bụ Haus of Kọmọns n’obi gọọmenti, n’isi obodo ahụ bụ Ottawa.

Mgbe ọbụna e mere ntụli aka, onye isi otu ndọrọndọrọ ọbụna kachasịrị nwete ndị nnọchite anya na Haus ọf Kọmọns ga-abụrụzị onye isi ala.

Na ntụli aka ahụ e mere ụnyaa na Kanada, ndị otu Libral Pati nwetere ndị nnọchite anya mkpụrụ mmadụ 157. Ndị na-esote ha n’azụ bụ ndị otu Konzavetiv, ndị gbara onye nke abụọ site n’inwete ndị nnọchite anya mmadụ 121. Ndị Blọk Kebekụa jiri mmadụ 32 gbaa onye nke atọ, ebe ndị Niu Demokratik Pati jiri mmadụ 24 gbaa onye nke anọ. Ndị Grin Pati nwetere mmadụ atọ.

Mgbe ọ na-ekele ndị pati ya na ndị soro tiri ya mkpu, Justin Trudeau kwuru na gọọmenti ya ga-elekwata ndị Kanada niile, n’agbanyeghị na e nwere mpaghara ndị na-akwadoghị otu Libral Pati chacha. Mpaghara ndị ahụ gụnyere prọvịnsụ Albata na Saskachịwan.

Justin Trudeau bụ onye isi ala Kanada kemgbe afọ anọ, site na mmeri ndị Libral Pati nwere na ntụli aka nke e mere n’afọ 2015.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.