Korona: Ndị Ụmụchu Enyela Ụfọdụ Ụmụafọ Nkwanyeugwu Maka Ezi Ọrụ

Apr 15, 2021 - 16:48
 0
Korona: Ndị Ụmụchu Enyela Ụfọdụ Ụmụafọ Nkwanyeugwu Maka Ezi Ọrụ

Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-abụ e kelee onye gburu ehi, ọ hụ ewu o gbuo; ma sịkwa na ọ na-abụ a kwanyere dike ùgwù maka ihe dị ike o mere, o mee karịa.

N'ịgbaso nke a, ndị obodo Ụmụchu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Agụata na steeti Anambra enyela asambodo nkwanyeugwu nyegara ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ, ndị gbara mbọ ma nyekwa nkwàdo n'ụzọ dị iche iche n'ime oge a ọrịa nje korona mere ndị mmadụ mkpamkpa dị egwu n'ụzọ dị iche iche.

Mmemme inye nkwanyeugwu ahụ e mere na nsonso a bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ezumeezu obodo ahụ (bụ 'Umuchu Town Hall') ma bụrụ nke a nọkwara na ya wee kpọpụta ndị tuuru ùgò n'asọmpi 'raffle draw' ndị obodo ahụ chịkọbara iji mee ihe obiañụrị ma kwàlitekwa ezi ọnọdụ mmekọrịta na ịdịnotu n'obodo ahụ.

Oge ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ, eze ọdịnala Ụmụchu, bụ Igwe Godson Ezechukwu sị na ebumnobi nkwanyeugwu ahụ bụ iji kelee ha maka ezi ntụnye dara ụda ha mere n'agha ahụ a na-ebu megide ọrịa korona, na n'ịkwàlite ezi ọnọdụ nchekwa na mmepe obodo ahụ n'ụzọ dị iche iche.

Dịka ọ na-ekwe nkwà na ha ga na-eme ihe ahụ na mgbe na mgbe, ọ gwakwazịrị ndị soro wee nweta ihe nkwanyeugwu ahụ ka ha mara na e mere nke ahụ iji gbàá ha ume maka ezi ọrụ ha, ma gbakwa ha ume ịga n'ihu mee nke ka nke n'ọdịnihu; ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ọzọ enwetaghị ka ha jisie ike n'ọrụ ọma ha na-arụ n'obodo ahụ n'ihi na anya na-ahụ ha, nke na o nwere ike ịbụ oge nke ha echi.
 
N'okwu nke ya, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Emeka Ononuju kpọpụtasịrị ụfọdụ mbọ dị iche iche ndị ahụ gbara, mgbataọsọ ha nà ntụnye ha mere iji belatara ndị obodo ahụ ihe isi ike na ụbịam, ọkachasị n'ime oge ahụ ọrịa korona kacha eme mkpamkpa nakwa oge ahụ a sị onye ọbụla chịkpuo ụkwụ n'ụlọ n'ihi ọrịa korona, nke mezịrị ka ihe siere ụmụ mmadụ na ọtụtụ ezinụlọ dị iche iche ike n'oge ahụ.

O kelere ndị ahụ maka ezi ntụnye ha, ma gwakwazie ha ka ha jisie ike n'ọrụ, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ọzọ bụkwa ndị akajiakụ ka ha sonyebekwa n'ezi ọrụ dị etu ahụ, n'ihi na ihe dị mma dị mma nñòmi.

N'okwu ha n'ótù n'ótù, ụfọdụ ndị soro nweta onyinye nkwanyeugwu ahụ, nke gụnyere Maazị Oliver Anulumko na Maazị Okey Ibedu kèlèrè ọchịchị obodo Ụmụchu maka ezi ọrụ dị iche iche ha na-arụ n'ịkwalite mmepe, ọganihu na ịdịnotu n'obodo ahụ, ma kelekwa ha maka ịhụta mkpa ọ dị inye ha ihe nkwanyeugwu ahụ maka ntụnye ha mere. 

Ha kọwara onyinye nkwanyeugwu ahụ dịka nnukwu ihe agbamume nyegara ha, ma kwezie nkwà ịga n'ihu na-akwàdo ma na-akwàlite ọdịmma obodo ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484