Korona: Onye Ọrụ Nchekwa Asụgbuola Nwokorobịa Ozo n'Ọnịtsha

May 6, 2020 - 20:28
Jan 22, 2021 - 21:20
 0
Korona: Onye Ọrụ Nchekwa Asụgbuola Nwokorobịa Ozo n'Ọnịtsha

Izunna Okafor, Awka

Ọ kpọtụkwara ọzọ n'Ọnịtsha dị na steeti Anambra n'ọdịnso a, dịka otu onye ọrụ nchekwa ọzọ jiri mmà wee sụgbuo otu nwata nwokobịa ọzọ n'ebe ahụ. Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ Maazị Haruna Mohammed.

Dịka akụkọ siri kọọ, nne nwata nwokorobịa ahụ e gbùrù egbu kpọrọ nwa ya nwaanyị wee gaa ịzụrụ ihe n'ahịa; mana mgbe ha ruru, onye ọrụ nchekwa ekweghị ka ọ bàta ime ahịa ahụ n'ihi na o kpughị ihe ahụ e ji ekpuchi imi na ọnụ, (bụ nke a maara dịka 'face mask' na bekee).

Ọ dị ncheta na gọọmenti steeti Anambra (oge ọ na-amaghèpu ụfọdụ ihe dị iche iche ọ machiri n'ihi ọrịa nje korona) nyèrè ntụziaka ka onye ọbụla ga-aga ahịa maọbụ pụta ezi maka ihe ọbụla kaba ahụ jiri uwe imi na ọnụ ahụ wee kpuchie imi ya, maka na a ga-ejide onye ọbụla ekpuchighị imi ya.

Ka o sila dị, onye ọrụ nchekwa ahụ aha ya bụ Maazị Ibuchi Nwoju na nwaanyị ahụ malitere nwebe okwu n'ihi na o kweghị ya ka ọ gafèé n'ekpuchighị imi ya, nke mezịrị ka ya bụ nwaanyị ga kpọọ nwa ya nwoke, bụ Cletus Chisom (gbara ahọ iri abụọ na abụọ); ya bụ nwokorobịa wee buru mmà wụchaa n'ebe ahụ ozigbo.

Ka o ruru n'ebe ahụ, o jiri mma ahụ wee bànye onye ọrụ nchekwa ahụ ọgụ, ha abụọ wee lụba; mana okwu dàgharịzịrị oge onye ọrụ nchekwa ahụ (n'ịzọ onwe ya ndụ) napụtazịrị nwokorobị ahụ mmà ahụ, ma were ya sụọ ya n'obi, o wee dàá n'ala, sọsịa n'ebe ahụ.

Ngwa ngwa nwokorobịa ahụ dàrà, e bùrù ya gaa ụlọ ahụ ike Goodnews dị 'n'Ọnịtsha ahụ, mana mgbe e ruzịrị ebe ahụ, dọkịta lelechaara ya ahụ, wee fee n'isi, sị na ụkwa a na-apị, na mkpụrụ adịghị ya, nke pụtara na nwata nwoke ahụ ejebela obodo afụdobe. A dọnyekwazịrị ozu ya n'ụlọ nchekwa ozu 'Toronto Hospital Mortuary' ebe a ga-anọ wee lelee ya ahụ iji chọpụta ihe butere ọnwụ ya n'ezie.

Ka ọ dị ugbua, aka ndị uwe ojii anwụchiele ya bụ onye ọrụ nchekwa gburu ọchụ ahụ, bụkwa onye steeti Aba (gbara ahọ iri abụọ na isii) ma biri ebiri n'Ọnịtsha ebe ọ nọ agbara onwe ya mbọ.

Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abang nyekwazịrị ntuziaka ka e nyefèé okwu ahụ n'aka ngalaba ọrụ uwe ojii pụrụ iche, bụ ngalaba State Criminal Investigation Department dị n'Awka, iji wee lebàra ya anya etu kwesiri ma mekwa nnyocha miri èmi banyere ya bụ ajọ ọdachi ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.