Kwanyerenụ Ụmụ Afọ Naijiria Ugwu Otú Ndị Gọvanọ Gwara Ụlọ Omeiwu

Nov 21, 2019 - 20:24
Jan 24, 2021 - 05:14
 0
Kwanyerenụ Ụmụ Afọ Naijiria Ugwu Otú Ndị Gọvanọ Gwara Ụlọ Omeiwu

Ibe Kelechukwu, Ibadan

Otu jikọtara aka na-achị steeti niile n'ala Naijiria adụọla Ụlọ Omeiwu ọdụ ka ha kwụsịtụ ịga n'ihu na ngụpụta nke abụọ maka iwu okwu ịkpọ asị nke dị ha n'ihu ugbua iji hụ na ha lebara anya n'uche ụmụ Naijiria. Osote Onyeisi Otú Ndị Gọvanọ ahụ na Gọvanọ Sokoto Steeti, Aminu Tambuwal, nyere ndụmọdụ a oge ọ na-aza ajụjụ sitere n'aka ndị nta akụkọ oge ndị gọvanọ ahụ mechara nzukọ ha n'isi ala obodo anyị, Abuja, n'abalị ụbọchị Wednezdee.

Ọ dụrụ ndị omeiwu etiti ala anyị ka ha kwanyere otu ụmụ Naijiria si ahụ ya bụ iwu ugwu. "O nwebeghị oge m nụrụ na gọọmenti pụtara kwuo na ọ kwadoro ọnwụ maka okwu ịkpọ asị. E kwenyere m na Ụlọ Omeiwu ga-ezukọ iji nụ uche ụmụ Naijiria n'iwu ahụ, ka ewere soro ụzọ iwu kwadoro maka ime iwu, ka ewere nweta uche ụmụ Naijiria ọ bụghị nanị nke ndị gọvanọ n'ebe iwu ahụ dị. Ha kwesịrị ịsọpụrụ uche ụmụ Naijiria n'ụzọ ọ bụla iwu ọhụrụ ahụ na-aga tupu etinye ya n'iwu ala anyị ma ọ bụ kachapụ ya," ka Tambuwal kwuru.

Kamgbe Iwu gbasara okwu ịkpọ asị ahụ pụtara, ụmụ Naijiria bụzi ndị na-agụ okwu ọnụ tupu ha ekwuo karịsịa n'ebe o metụtara ọchịchị ala anyị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.