Lee Aha Ụfọdụ Anụmanụ n'Asụsụ Igbo

Oct 18, 2020 - 00:12
Jan 25, 2021 - 00:13
 0
Lee Aha Ụfọdụ Anụmanụ n'Asụsụ Igbo

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ndị Igbo sị na ọ na-abụ a kọwaruo, a maruo, maka na onye amaghị ọfọ nna ya nwèrè ike ịkpọ ya mkpirisi osisi nkịtị. Ọ bụ n'ihi nke a ka o jiri dị mkpà idepụtesi aha ụfọdụ anụmanụ na ihe a na-akpọ ha n'asụsụ Igbo. Ọ bụ ihe doro anya na ụfọdụ ndị Igbo amaghị ihe a na-akpọ ụfọdụ anụmanụ n'asụsụ Igbo, ebe aha anụmanụ ụfọdụ yiri onwe ha na-agbasàsịkwa ụfọdụ ndị mmadụ anya. Nke ahụ wee bụrụzie ihe mgbagwòjuanya nyéré ụfọdụ mmadụ. O nwèrè anụ ị na-achọ aha ya n'Igbo, edemede a ga-enyere gị aka. Ebe ọkụ nyụọrọ taa, a wụsa ọwa; izuụka ọzọ, anyị ebidokwa ebe anyị kwụsịrị.

Aha bekee ụfọdụ anụmanụ na ihe a na-akpọ ha n'asụsụ Igbo gụnyèrè: 

Guinea Fowl — Ọgazị

Duck —Ọbọgwu

Turkey —Tolotolo/Torotoro 

Ostrich — Enyi Nnụnụ

Pigeon — Nduru/Ndulu

Antelope — Ele/Ene

Bed Bug — Chinchi

Ram — Ebune/Ebule/Ebili

Squirrel — Ọsa

Hyena — Nkịta Ọhịa/Nkịta Ọfịa

Dog—  Nkịta

Horse — Ịnyịnyà

Camel — Ịnyịnyà Ibu

Wall Gecko — Agu Ụnọ

Egret – Chekeleke

Snake — Agwọ

Chicken — Nwa Ọkụkọ

Pig — Ézì

Elephant — Ényí

Monkey — Ènwè

Chimpanzee — Àdáka

Gorilla — Ọzọdịmgba

Rat —  Oke

Hen — Nnekwu Ọkụkọ

Cock — Okeọkpà

Fowl — Ọkụkọ

Crocodile  — Agụiyi

Cat — Buusu/Nwonogbo/Nwamba

Toad — Awọ

Frog — Mbara/Mbala/ Nte/Akiri

Lizard — Ngwere/Ngwele

Mosquito —Anwụ Ntà

Grasshopper — Ụkpana

Kite — Nkwọ

Spider — Ududo

Praying Mantis — Ogolongolo/Ogonongono

Earthworm — Ídìdè

Cricket —Mbụzụ/Mgbaja

Bat — Ụsụ

Scorpion — Akpị

Bee — Añụ

Crab — Nshịkọ

Millipede — Esu

Cockroach — Ụchịcha

Worm — Òkpò

Centipede — Agbakụrụ/Ọgbakụrụ

Grasscutter — Nchì

Woodpecker/Speight — Ọtụrụkpokpo/Ọtụkpokpo

Civet —  Edi/Edi Ụra

Butterfly — Oloko Mbụba/Olokoro Mbụba

Chameleon — Ugwumagala/Ugwumagana

Fox — Nyanwụrụmede

Fish — Azụ

Owl = Ikwìkwii/Iyi Ọchị

Pig — Ezì

Lion — Ọdụ

Tiger — Agụ

Leopard — Agụ Awọlọ/Agụ Awọrọ

Wasp — Èbù

Weaver ant — Ídò

Porcupine — Ébì/Óbì Ọgwụ

Shrew — Nkakwụ/Nkapị 

Rat — Oke

Eleke Ntị Ọba — Swallow Bird

Hog — Ezi Ọhịa

Hawk —Agụmbu

Periwinkle — Isam

Bush Fowl — Ọkwà

Black Hawk — Mgba

Goose — Ọbọgwụ Mmiri

Boa Constrictor — Eke Ọgbà

Reticulated Python — Eke Ukwu

Hippopotamus —Akụm Tiwara Ụgbọ/Utobo

Iguana — Ngwèrè Aghọ

Egret — Chekeleke

Donkey — Jakị

Turtle — Mbe Mmiri

Eel — Azụ Ikoro

Dragon Fly —Tatambeneke/Tatambeleke

Maggot — Ikpùrú

Buffalo — Atụ

Wolf — Agụ Owulu

Sparrow — Nza

Parrot — Icheoku 

Viper — Abụ Ala/Abụala

Locusts —Igwulube

Galagos/Bush Baby — Ikìlì/Ikìrì

Gaboon Viper = Echi Eteka

Crayfish — Isha.


Maka Onye Dere Edemede A:

Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenatọr dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, onye nta akụkọ na onye nkwàlite asụsụ Igbo. Ọ gụrụ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ ebe o mere maka ihe ọmụmụ nhazi ọhanaeze bụ 'Public Administration' n'olu bekee.

Dịka onye edemede, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri abụọ na ise n'ihe gbasaara edemede, site n'ala anyị na n'ogoogo mba òfèsi. Nturu ùgò na nkwanye ùgwù ndị ahụ gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016;  Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Dịka onye nta akụkọ, ọ na-arụ n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra, ma na-arụkwa n'ụlọ ọrụ Igbo Radio.

Izunna na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa onye e jìrì ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo wee mara.
O deela akwụkwọ asatọ, ma nwekwa edemede karịrị narị asatọ n'ọnụ ọgụgụ o bipùtagòrò n'ìkùkù. Ọ bụ onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.