Mbize: Gọọmenti Etiti Ekwe Nkwà Ịgbatara Anambra Ọsọ Enyemaka

Oct 10, 2019 - 01:28
Jan 22, 2021 - 05:47
 0
Mbize: Gọọmenti Etiti Ekwe Nkwà Ịgbatara Anambra Ọsọ Enyemaka

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

N'ihi ajọ ọnọdụ mbize ahụ na-ebi obodo dị iche iche aka ọjọọ ma na-emekwa mkpamkpa na mpaghara ebe dị iche iche na steeti Anambra; gọọmenti etiti ekwela nkwà ịgbatara steeti ahụ ọsọ enyemaka aka ọkụ aka ọkụ n'ebe dị iche iche mbize na-enye nsogbu.

Nke a bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ Minista ntà na-ahụ maka gburugburu n'ala anyị, bụ Oriakụ Sharọn Ikeazọr, oge ọ gagharịcha ileta ebe dị iche iche mbize na akpa ike na steeti Anambra, bụkwa nke ọ bụ osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke dughàrịrị ya.

O kwuru hoohaa na ihe ọ hụrụ riri ya ọnụ banyere ebe dị iche iche mbize mebìsìgòrò na steeti ahụ, metere ndị na obodo nke ahụ metụtara ebere, ma kwukwazie na gọọmenti etiti ga-eme ihe bànyere nke ahụ n'egbughị oge, iji mee ka ya bụ ajọ ọnọdụ gharazie ịgbasawanye maka na ọ na-abụ e gbubìghị ntutu n'oge, ọ kwụọ ọhịa.
Ka ọ na-ekwupụta na ya ka ga-agagharị iletakwu ụfọdụ ebe ndị ọzọ dị iche iche mbize na-enye nsogbu na ya bụ steeti, Oriakụ Ikeazọr kwuru na gọọmenti etiti ga-amàlite ọrụ banyere nke ahụ, ma tinyegide ego na ya, na-eletakwa ya wee ruo mgbe a rụchara ha, iji hụ na ndị ji ya bụ ọrụ ngo rụrùrù ya n'isi, ma rụọ ya nke ọma na otu o kwesiri.

Na ntụnye nke ya, osote aka na-achị steeti ahụ, bụ Dọkịta Okeke kwàrà arịrị na mbize ebibiela ọtụtụ ihe ma kparakwa ọtụtụ ala, n'agbanyeghị na Anambra enweghị ụbara ala nke otu ahụ, ma sịkwa na gọọmenti steeti ahụ ga-ejìkọ aka ọnụ, ya na gọọmenti etiti, iji hụ na a rụchapụrụ ya bụ ọrụ ma kpàá mbize ndị ahụ eze n'oge adịghị anya.

O mere ka a mara na ụfọdụ ihe kpatàrà mgbasawanye mbize n'ụfọdụ ebe dị iche iche na steeti ahụ bụ otu ndị mmadụ si eme ihe ekwesighị ekwesi na mpaghara gburugburu ha, ma kọwaa mkpa ọ dị na ndị ndu obodo dị iche iche a ga-abagide n'amụmà nkuzi ime ka ndị obodo ha dị iche iche mara ka e si echukwa ma na-echekwaba gburugburu, ma kwụsịzie ịdị na-ekpofù ahịhịa n'ebe ekwesighị ekwesi, ọbụnadị dịka ọ dọkwazirị ndị Anambra aka na ntị ka ha kwụsị ime ihe dị òtù ahụ, n'ihi na onye ọbụla e jidere ga-eji anya ya wee hụ ntị ya na-ejighị ènyò.

Ọ dị nchèta na mbize ebibiela ọtụtụ ihe na steeti Anambra, ma ka na-akpakwa ike n'ọtụtụ mpaghara ebe dị iche iche. Ọtụtụ ebe dị iche iche mbize na-akpa ike na steeti Anambra gụnyere Ebenatọr, dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South', Ụmụdim na Uruagụ dị na 'Nnewi North', Ire Obosi dị n'Idemili North', Ụmụachịana dị n'Ekwulọbịa, n'okpuru ọchịchị Agụata; Ụmụatụọra, dị n'Enugwu-Ukwu, n'okpuru ọchịchị Njikọka; Ọmagba 'Phase -Two' dị n'Ọnịtsha 'North' tinyere ọtụtụ ebe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.