Michael Adebolajo zaburu onu ya n’ulo ikpe na Kenya n’afo 2010

Michael Adebolajo zaburu onu ya n’ulo ikpe na Kenya n’afo 2010

Jun 3, 2013 - 05:39
Jan 21, 2021 - 05:40
 0
Michael Adebolajo zaburu onu ya n’ulo ikpe na Kenya n’afo 2010
: :
playing

Anyị nwetere ozi na Michael Adebolajo, otu n’ime mmadụ abụọ ahụ gburu onye soja mba Britain na Woolwich, zaburu ọnụ ya n’ụlọ ikpe na Kenya n’afọ 2010.

A na-ekwu na e jidere ya oge ọ na-achọ ụzọ ọ ga-esi aga mba Somali maka isonyere ndị agha isi ekwe ọnwụ al-Shabab nke mba Somali. A gbaara ya ụgbọ nwa mkpị na Kenya, ka e kpechara ya ikpe.

N’izu ụka gara aga, Michael na onye ogbo ya buru agha iyi egwu na Woolwich. Ha jiri ụgbọala kụtuo otu onye soja mba Britain na-agara onwe ya. Kama ha ga-enyere onye amị ahụ na-anwụ anwụ aka, Michael na onye ogbo ya mịpụtara mma were gbukasịa nwoke onye soja ahụ. Ọ nwụrụ ebe ahụ n’ike, n’etiti okporo ụzọ.

Ndị uwe ojii rutere ebe ahụ ka o mechara ihe dịka nkeji 20. Ha gbara Michael na di nna ya egbe, tupu e jido ha.

Taa bụ ụka, ndị nwe onye soja ahụ gbakọtara ebe ihe a mere maka ịkwanyere ya ugwu ịkpazụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.