Mkpa Ọ Dị Nwaanyi Inye Ohere Tupu Ọ Mụa Nwa Ọzọ

Aug 16, 2021 - 21:29
 0
Mkpa Ọ Dị Nwaanyi Inye Ohere Tupu Ọ Mụa Nwa Ọzọ

Uche Nwamba dere edemede a

Mgbe nwaanyị alụbeghị di, ọ na-ekwu na ya ga-amụ ụmụ anọ ma ọ bụ ise ma na ọ dịghị echeta na ọ dị mkpa inye ohere mgbe ọmụsịrị nwa nke mbụ tupu ọ mụa ọzọ. Ụfọdụ na-asị na ha ga eji afọ atọ ma ọ bụ ise mụọ ụmụ ole ha chọrọ.Ndị na-ekwu out a amaghị na ọ nwere nsogbu dị na ya.

N’ezie, nwanyị tụrụ ime ọhụrụ, o nwere ndị ọ na-enye nsogbu.Tupu ha enweta onwe ha, ọ ga eru ihe dịka ọnwa isii. Na ọnwa ahụ nile, ha na arịa ọrịa n’ihi na ọtụtụ ihe dị mkpa na-enyere ahụ aka a dịghị n’ahụ ha. Oge ụfọdụ, ha adịghị eri nri nke ọma. Mgbe ụfọdụ, agụụ adịghị agụ ha. Ụfọdụ a naghị enwe ego iri ihe na-agụ ha.Mgbe ha ga amalite inweta onwe ha, afọ ime ha eruoola ihe dịka ọnwa ise ma ọ bụ.Ike a naghị  adịkwa ha ime ihe  ha chọrọ ma ọ bụ ịga ozi n’ụlọ ha.

Mgbe ha mụsịrị nwa, site na ọnwa mbụ ruo na ọnwa atọ ma ọ bụ anọ,ha a naghị enwe ike n’ihi na  ọtụtụ ihe pụrụ ha n’ahụ mgbe ha mụrụ nwa tinyere nwa n’ańụ ha ara.

Ihe ndị a ka o ji kwesi na nwayị ga-enye onwe ya ezi ohere tupu ọtụrụ ime ọzọ. Ọ bụrụ na o nyeghị onwe ya ohere, nke a ga-eme n’ọ dị ime ọzọ mgbe ahụ ya anọchibeghị,ọ na enwe ọtụtụ nsogbu. Ọ bụrụ na nwanyị mụa nwa, onyeghị ohere were dị ime ọzọ, nke a ga eme ka ọ ghara inwe ike ilebara onwe ya na nwa ya anya n’ihi mgbakasị ahụ.

Ọ na-enwe mgbakasị ahụ, obi ụtọ anaghị adịrị nwa ahụ n’ihi na nne ya adịghị elebara ya anya otu okwesịrị. Mgbe ụfọdụ, nke a ga-eme ka nwa ahụ ghara inwe ezi otuto n’ihi na nwa ahụ agaghị ańụ mmiri ara lọlụ alọ n’ihi afọ ọhụrụ ahụ nne ya bu.

N’ezie, ọ bụrụ na nwanyị enyeghị ohere mgbe ọ mụsịrị nwa were dị ime ọzọ, ọ na-enwe ọtụtụ nsogbu.Nke mbụ bụ na ahụ ike ya agaghị ezu oke, ọ gaghị ejenwu ozi n’ụlọ ya.

Ọ bụrụ nwanyị enweghi ihe ọ na-alụ ma ọ bụ na di ya ejighi ego ikwado ya, ọ malite na-ata ahụ. Ịzụ otu nwa dị ọlụ, kedụzị maka mgbe nwanyị dị ime ma kuru nwa n’aka mgbe okwesịghị. Nke a ga-eme nwanyị ahụ ịnọ na ezigbo mkpa. Mgbe ọ mụrụ nke abụọ, nsogbu ya adị abụọ. O rue mgbe ha ga-ebido akwụkwọ, nsogbu adị n’ihi na ọ bụ otu ihe ka ọ ga na-achọrọ ha abụọ otu mgbe. Idebanya aha otu onye na-afia ahụ ma ya bụrụ mmadụ abụọ na atọ otu mgbe. Ọ bụrụ ebe ego adịghị, a hapụ otu n’ụlọ rue ihe dị ka afọ isii tupu e bidoro ya akwụkwọ.

Mana ọ bụrụ na nne nyere ohere tupu ọ dị ime ọzọ, ọ gaghị enwe nsogbu ọ bụla na iledo nwa ahụ anya nakwa I bidoro ya akwụkwọ. Ọzọkwa, ya onwe ya bụ nne ga-enwe ahụ ike zuru oke iji lụọ ọlụ ya ma ọ bụ zụọ ahịa, chụtakwa ego iji nye aka na ezinaụlọ ya n’ihi na ọ gaghị ahapụrụ nanị di ya ịkpata ego e ji enye aka na ezinaụlọ ha.

Ọ bụrụ na nwanyị enyeghị ohere na nke ọ mụrụ tupu ọ dị ime ọzọ,ọ ga-eme na ọ gaghị enye nke o bu uzo mụ ezi nlekọta na ihunanya zuru oke maka na nwa a mụrụ ọhụrụ chọrọ ka nne ya na eku ya n’ahụ mgbe ọ bụla ọ chọrọ, na-enye ya ara na nri mgbe ọ chọrọ. Ọzọkwa, ọ bụrụ na ahụ adịghị nwa ahụ, ọ ga-achọ ka nne ya kwọrọ ya n’azụ ma ọ bụ kuru ya na aka mana ọ bụrụ na nne ya bu afọ, ọ gaghị enwecha ohere imere nwa ahụ ihe nile ọ chọrọ mgbe ahụ.

Inye ohere wee dị ime na-eme ka nwanyị na nwa nwee ahụ ike zuru oke ghara ịdị na-atufu ego n’ụlọ ọgwụ. Ọzọkwa, nwanyị ga-enwe ike na-eso di ya na-apụ apụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484