Mmadụ 35 Agbanaị́la Ọnwụ Ike, Kà Ihe Mberede Okporoụzọ Mere n'Awka

Nov 1, 2021 - 19:47
 0
Mmadụ 35 Agbanaị́la Ọnwụ Ike, Kà Ihe Mberede Okporoụzọ Mere n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụmụnwoke ruru iri atọ n'ọnụọgụgụ nọrọ na nsonso a wee gbanahị ọnwụ mberede káárá ịtā isi ha, oge ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka mgbasaozi na mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' n'ime steeti Anambra, bụ DRC Margaret B. Onabe kwupụtara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a.

O mere ka a mara na ihe mberede okporoụzọ ahụ dapụtara na mpaghara njikọụzọ 'UNUZIK Junction' nke okporoụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, ma bụrụkwa nke metụtara ụgbọala anọ.

Dịka o siri kọwaa, ụgbọala anọ ahụ ihe mberede okporoụzọ metụtara gụnyèrè ụgbọala bọọsụ 'Toyota Hiace' nwere ákàrà ENU 830 ZX, ụgbọala Nissan Bọọsụ nwere akàrà UKP 397 YP, nnukwu ụgbọala Tippa nwere ákàrà FGG 391 ZV, na nnukwu ụgbọala gwongworo M/Benz e ji ebu ibu nwéré akàrà AKD 366 XJ.

Ọgara n'ihu kọwaa na mmadụ iri atọ na ise niile nọcha n'ime ụgbọala ndị ahụ bụcha ụmụnwoke, ma gbakwa akaebe na o nweghị onye ọbụla n'ime ndị ha nwetara mmerụahụ maọbụ tụfuo ndụ ya n'ihe mberede okporoụzọ ahụ.

O mekwara ka a mara na ndị ọrụ FRSC gbaara gaba ebe ahụ ozigbo ha nwetara ozi banyere ihe mberede okporoụzọ ahụ, ma nyekwazie aka bughasịa ụgbọala ahụ na ihe ndị ọzọ dachisiri ụzọ n'ebe ahụ iji gbochie inwe agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ahụ.

N'okwu nke ya banyere ihe mberede okporoụzọ ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi kelere Chineke na o nweghị onye ọbụla n'ime ndị ahụ nwetere mmerụahụ maọbụ tụfuo ndụ ha n'ihe ọdàchi okporoụzọ ahụ.

O nyekwazịrị ndị na-anyà ụgbọala ndụmọdụ ka ha zèéré ịgba oke ọsọ, n'ihi na ọ bụ ya na-ewètekarị ihe mberede okporụzọ; ọbụladị dịka ọ kpọkukwara ha ka ha na-erube isi nye iwu na-achị okporoụzọ oge ọbụla ha nọ̀ n'okporoụzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484