Mmadụ Abụọ Alapụla Ọnwụ, Dịka Ụgbọala Abụọ Kwòkọrọ Isi Ọnụ n'Anambra

May 25, 2021 - 21:26
May 30, 2021 - 18:24
 0
Mmadụ Abụọ Alapụla Ọnwụ, Dịka Ụgbọala Abụọ Kwòkọrọ Isi Ọnụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụnnọ ihe ịtụnanya na ihe ịtụ mmamma, dịka mmadụ abụọ gbanịhịrị ọnwụ ha, oge ụgbọala abụọ kwòkọsịrị isi ọnụ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Ya bụ ihe mberede dapụtara na mpaghara ebe ahụ ụgbọala na-agba n'elu na n'ala dị n'Amawbia, n'ogologo ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha; ma bụrụkwa nke dapụtara n'etiti ụgbọala Sienna abụọ, bụkwazị nke otu n'ime ha màgòòrò ibe ya n'elu ozigbo ya bụ ihe mberede dapụtaa.

Dịka onye ọnọmgbeomere siri kọwaa, ihe kpatara ihe mberede ahụ bụ ihe mgbochiụzọ ndị na-arụ ụzọ ahụ dọbara n'otu akụkụ okporoụzọ ahụ, n'enweghị ihe ọbụla ha tinyere n'ihu ga na-egosi ndị na-anyà ụgbọala na ndị ọzọ na-agba n'okporoụzọ ahụ na e nwere ihe mgbochiụzọ dị n'ebe ahụ, ka ha wee zèére ha.

N'okwu ya banyere ihe mberede okporoụzọ ahụ oge ọ gara n'ebe ahụ, onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ijè awele n'okporoụzọ, bụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi mere ka a mara na ọ bụ n'ihe dịka elekere anọ nke ọnụ ụtụtụ ka ihe mberede ahụ jiri mee.

O kwuru na n'agbanyèghị na ihe mberede okporoụzọ ahụ dapụtara n'ụdị dị oké égwù, na o nweghị onye ọbụla nwụrụ n'ebe ahụ, n'ábụghị naanị na ụgbọala abụọ ahụ kụrụ onwe ha ihe tinka kụrụ paanụ, ebe ndị na-anyàkwa ya nwètakwàrà mmerụahụ n'ụdị dị iche iche, bụkwazị ndị e buru gaa n'ụlọọgwụ maka inye ha ọgwụgwọ.

Ọ kpọrọ òkù ka ndị na-arụ okporoụzọ na-enwe ihe ngosi kwesiri ekwesi n'ebe dịgasị mkpà, ọkachasị ma oge ha na-arụ ụzọ na oge ha rụchara ya, n'ihi na nke ahụ ga-enyere ndị na-anyà ụgbọala aka imara ihe dị n'ihu na etu okporoụzọ ahụ siri dị. 

Ọ dụkwàzịrị ndị na-anyà ụgbọala ka ha kwụsị ịnyà ụkwụ ụgbọala kara nka maọbụ nke ike gwụgoro, ya na ịgba oke ọsọ, n'ihi na ihe ndị ahụ sokwa eweta ihe mberede okporoụzọ, ọkachasị n'oge udummiri a a nọ na ya ugbua, maka na àlà na-amị amị.

N'okwu nke ya oge ọ gachara ebe ahụ ihe mberede ahụ mere, Kọmishọna na-ahụ maka njem okporoụzọ na steeti Anambra, bụ Maazị Afam Mbanefo, kpọrọ òkù ka e nwee ezi mmekọrịta na njikọaka n'etiti ndị na-arụ okporoụzọ na ndị e ji okwu ha agba ìzù, iji wee tụkọọ arò ọnụ, ma wepụta usoro kacha mma a ga-esi wee rụọ ya bụ ụzọ n'ewètaraghị ndị mmadụ ihe égwù, ihe ize ndụ maọbụ ọnọdụ ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche.

Dịka ọ na-ekele Chineke na o nweghị onye ọbụla tụfùrù ndụ ya n'ihe mberede okporoụzọ ahụ, Kọmishọna ahụ jikwàzịrị ohere ahụ wee dọọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha na-eleru ụgbọala ha anya nke ọma tupuu ha eburu ya pụta n'okporoụzọ, ma zèkwara ibu oke ibu karịrị ha, n'ihi na ihe ndị ahụ sòkwà atụnye ụtụ n'ihe mberede okporoụzọ na-adapụtagasị na mpaghara ebe dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484