Mmadụ Abụọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ n'Anambra

Apr 1, 2021 - 18:12
 0
Mmadụ Abụọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti Anambra ataala isi mmadụ abụọ, ma tinyekwa mmadụ abụọ ndị ọzọ n'ahụ ụfụ na ihe mmerụahụ n'ụdị dị iche iche.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' na steeti Anambra, bụ SRC Florence Edor mere ka a mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, ma kọwaa na ihe mberede okporoụzọ ahụ dapụtara n'ụzọ Obiụnọ dị n'Ekwulọbịa, n'okpuru ọchịchị Agụata.

O kwuru na ya bụ ihe mberede dapụtara n'ihi ịgba oke ọsọ, nke otu nwoke na-anya ụgbọala Lexus ES350 (nwéré ákàrà KSF 403 GD), bụ ónyé enweghịzịkwa ike ijidenwu ụgbọala ya n'ihi oke ọsọ ahụ ọ nọ na ya, nke mezịrị ka ọ kụtuo ụmụnwaanyị abụọ ji ụkwụ agara onwe ha, ma jirikwa oke ọsọ ahụ makpuo n'ime ụlọ dị n'akụkụ ebe ahụ, wee kpọrikọọ ụgbọala ya ma kpọrikọkwa onwe ya.

SRC Edor gara n'ihu kọwaa na mmadụ abụọ (nke gụnyere nwoke ahụ na-anyà ụgbọala ahụ, na otu nwaanyị) nwụrụ ihe mberede okporoụzọ ahụ, ma bụrụkwa ndị e buuru ozu ha ga dọnye ozu ha n'ụlọ nchekwa ozu 'Apex Mortuary'; ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ (otu nwoke na otu nwaanyị) nwetàrà mmerụahụ n'ụdị dị iche iche, ma bụrụkwazie ndị e buru gaa n'ụlọọgwụ dị nso ebe ahụ maka inye ha ọgwụgwọ.

N'okwu ya banyere ihe mberede okporoụzọ ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra bụ Maazị Andrew A. Kumapayi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha na-akpachapụ anya oge niile, zèére ịgba oke ọsọ, ma jirikwa nwayọ na uchè na-anyà ụgbọala. 

O kwuru na ọ bụ ịgba oke ọsọ na-ewetakarị ọkà n'ọnụọgụgụ ihe mberede okporoụzọ na-adapụta aghara aghara na mpaghara ebe dị iche iche steeti ahụ. O chètààrà ha na oji nwanyọ anaghị emerụ ahụ, ma dụọ ha ka ha zèére ịgba oke ọsọ.

O kpekwazịrị ka ndị nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ gbakere mgwamgwa, ma kasikwa ezinụlọ ndị nke ha nwụrụ anwụ obi, kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụ obi ndị ahụ nwụrụ anwụ ezumike udo.


N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, mmadụa abụọ ọzọ nwetara mmerụahụ n'ụdị dị iche iche, n'ihe mberede okporoụzọ ọzọ dapụtara na steeti Anambra, oge otu obere ụgbọala jiri ọsọ wee makpuo n'òkpúrù nnukwu ụgbọala gwongworo na-aga aga.

Ihe mberede ahụ dapụtara na ncherịta ihu ọdụ mmanụ ụgbọala 'Ken Maduako Filling Station' dị n'Ihiala n'etiti nnukwu ụgbọala gwongworo a maara dịka 'trailer' n'asụsụ bekee (nwéré akara AGL 404 XY), nnukwu gwongworo ọzọ (nwere akara AKL 298 YU), na obere ụgbọala Hyundai (nwere akara UMA 192 HR.)

E buuru ndị ahụ nwetara mmerụahụ gaa ụlọ ahụike 'Our Lady of Lourdes Hospital' dị n'Ihiala ahụ site n'aka ndị ọrụ FRSC, maka inye ha ọgwụgwọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484