Mmadụ abụọ anwụọla n’okwu ala n’Izii nke Ebonyi

Jul 18, 2020 - 16:16
Jan 26, 2021 - 16:18
 0
Mmadụ abụọ anwụọla n’okwu ala n’Izii nke Ebonyi

By Chidi Igwe, VON

Mmadụ abụọ anwụọla ebe ọtụtụ ihe ndị mmadụ mebiri dịka okwu ala dapụtara n’etiti ndị obodo Nguji Ojiegbe Onunwakpu na ndị Ndiegede nke dị na Igbeagu, dị na mpaghara okpuru ọchịchi Izii, Ebonyi steeti n’ụbọchị Wenesde.

Akụkọ na-akọwa na esem okwu a bidoro kamgbe afọ 2012.

Onye ntaakụkọ kwuru na mmadụ abụọ aha ha bụ Sunday Odom, dị afọ iri abụọ na anọ bụ onye obodo Onunwakpu, na Emmanuel Uguru nke Ndiegede bụ ndị nwụrụ n’ọgụ gbasara ala a.

Ọ bụ n’ịzuụka abụọ gara aga ka kọmịshọna na-ahụ maka oke ala na iweta udo bụ Stanley Okoro Emegha nke Ifeanyichukwu Igurube nọchịtere anya ya bịara njem nyocha na ntule ya bụ ala na-ese okwu ma gwa ndị obodo abụo a ka ha wepụ aka n’ala ahụ tupu gọọmenti ekpebie maka ya.

Otu onye nwa ya nwụrụ bụ Odom Abama kwuru na-egburu nwa ya nwoke na-agbanyeghị na o bụghị onye obodo ndị a na-ese okwu a.

Abama kwuru na nwa ya nwoke na nwanne ya nwaanyị gara ubi dị nsọ ala ahụ na-ebute okwu mgbe ndị okorobịa a na-ache na ha bụ ndị Ndiegede gbara ya egbe n’afọ.

O kwuru sị ” A nọ m n’ubi mgbe m nụrụ ozi na a gbara nwa m nwoke egbe, nwa m ka lụrụ nwaanyị nsonso a ma mụa kwa nwa nwaanyị. Gọọmentị biko gbatara anyị ọsọ enyem aka”.

Abama kọwara na-akpọrọ nwa ya gaa ụlọọgwụ ebe ọ nọ nwụọ.Eze Ogbodo Onunwakpu bụ Mbam Nwambam Ekpem, kwuputara na obi adịghị ya mma dịka ihe ndị obodo ya gabigara na ya bụ esemokwu ma sịkwa na ha na ndị obodo Ndịegede enweela nghọtahe ala mbụ kama ha doziri ya n’udo.

Ekpem katọrọ etu ndị ntoroọbịa siri lụsa ụmụnne ha ọgụ ma rịọ ka Gọvanọ Ebonyi bụ Dave Umahi gbatara ha ọso enyem aka.

Mazị Ominiyi Febian onye bụkwa onyeisi n’obodo Nguji kwuru na agbara ụlọ ya ọkụ ma mebie ubi osikapa ya.

O kwuru sị ” Ọ bụ n’ụbọchị wenesde ka m sị ubi alọta mgbe m nụrụ ụda egbe, a gbahachịrị m azụ. Ọ bụ ka ebe niile dere duu ka anyị chọpụtara na-agbara ụlo niile dị na Azungele ọkụ”.

N’otu aka ahụ, onye ode akwụkwọ otu a kpọrọ “Igbeagu Stakeholders Forum” katọrọ ihe mere ma sị ka gọọmentị gbatara ha ọsọ were dozie ya bụ esem okwu.

Ka nke a na-eme ka Eze obodo Nguji Ojiegbe bụ Innocent Igbeagụ kagburu ya bụ ọgụ dị n’etiti obodo abụọ a ma kelee ngalaba na-agba mbọ ihu na ewetara udo n’etiti ha.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bu Loveth Odah kwenyere na mwakpo mere, mana ọ sị na ọ bu otu nwoke di afọ iri asaa na ise nwụrụ site na ya.

Ọ sị na a na-achọbu nwoke ahụ, ma mechaa hụ ozu ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.