Mmadụ Ise Anwụọla Oge Ìtè Gaasị Gbọwara Na Lagos

Nov 17, 2021 - 22:52
 0
Mmadụ Ise Anwụọla Oge Ìtè Gaasị Gbọwara Na Lagos

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ nnukwu ihe ịgba anya mmiri na iru uju na Mushin dị na mpaghara Ladipo nke steeti Lagos oge ite ikuku mmụọ bụ gaasị gbowara ma gbuo mmadụ ise, merụọ mmadụ ruru iri na ise ahụ ma bibìsiekwa ọtụtụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ n'ebe ahụ.

Ya bụ ajọ ọdachi bụ nke dapụtara oge o jiri nkeji iri na ise gata elekere asatọ nke ụtụtụ ụbọchị Tuzdee ma bụrụkwa nke wetere ọnwụ ụfọdụ ndị o metụtara ozigbo ozigbo ahụ, bibikwa ihe gburu ego ruru nde kwuru nde naịra na gburugburu ebe ahụ o mere.

N'okwu ya banyere nke ahụ, ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ 'National Emergency Management Agency (NEMA), bụ Maazị Ibrahim Farinloye kwuru na ihe ahụ mere n'eziokwu, ma kọwaa na o mere n'ala ebe dị obosara, bụkwa ebe a e jigasịrị osisi wee kụọ ọkpọkọrọ ụlọahịa ebe a na-edebe ere gaasị e ji esi nri.

Otu onye ọnọmgbeomere, bụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya, kọwara na onye nwe ebe ahụ a na-ere gaasị so n'otu n'ime ndị nwụrụ oge ihe ahụ mere, ma kọwaa na nwoke ahụ na-agbanye gaasị n'ite gaasị dịgasị n'ime ọdụ ahịa ya ahụ ekwentị ya wee kụọ, bụkwazị nke dọrọ ọkụ gaasị ahụ mgbe ọ gara ịza onye na-akpọ ya, ihe niile wee gbarikọọ.

Onye ọzọ kwukwara na ọ nọ ebe ahụ mgbe ya bụ ihe mere, kọwàrà na e nwekwara otu onye nọ n'akụkụ  ebe ahụ a na-ere gaasị wee na-eghe akara mgbe nwoke ahụ nwe ebe ahụ bụ Maazị Sodiq na-agbagharị gaasị.

N'akụkọ ọgbụgbaama ya, otu onye n'ime ndị zọtara isi ha oge ahụ ya bụ ihe mere, bụ Maazị Olewaseun Adesegun kwuru na ọ na-asa ahụ na nso ebe ahụ mgbe ya bụ ihe mere, o wee wụọ ọsọ. O kwazịrị arịrị na ọga ya ejighị ndụ wee pụta n'ihi na ọ bụ ozu ya ka e butezịrị oge a na-achọgharị ndị mmadụ n'ebe ahụ. 

Ụfọdụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu agaala ebe ahụ ya bụ ihe mere, jiri anya ya hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe hụ, ma kasiekwa ndị tụfuru ndụ ndị nke ha obi, kpekwa ka ndị nwetara mmerụahụ gbakere ma nwere onwe ha n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484