Mmeghe Akwụkwọ: Ndị Nkụzi Awka North Enyela Onyinye Ihe Nkwado Adịmọcha

Jul 29, 2020 - 17:37
Jan 26, 2021 - 17:39
 0
Mmeghe Akwụkwọ: Ndị Nkụzi Awka North Enyela Onyinye Ihe Nkwado Adịmọcha

By Izunna Okafor

Dịka ọ bụ ihe doro anya na ụlọakwụkwọ ga-emepeghatị na steeti Anambra n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ ahọ a maka ndị nọ n'ogoogo ụfọdụ; ndị nkuzi akwụkwọ praịma nọ n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka North' nke steeti ahụ ejikọọla aka bute, ma nye onyinye ihe dị iche iche e ji akwalite adịmọcha.

Nke a, dịka o siri dòó anya, bụ na nkwadobe maka mmepe akwụkwọ ahụ, ma bụrụkwa ntụnye nke ha n'igbochi mgbasa ọrịa nje korona na n'ịkwàlite ọnọdụ adịmọcha n'ụlọakwụkwọ dị iche iche.

Akụrụngwa nkwàlite adịmọcha ahụ ndị nkuzi ahụ tụkọtara gụnyère bọkeeti mmiri dị iri asaa na asatọ n'ọnụọgụgụ, mkpọ mmanụ nkwọcha aka, bụ sanịtaịza dị iri asaa na asatọ n'ọnụọgụgụ, tinyere nchà mmiri dị iri asaa na asatọ n'ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa nke ha nyefèrè n'aka okpuru gọọmenti okpuru ọchịchị 'Awka North', maka ikesàrà ya ụlọakwụkwọ praịma niile dị n'okpuru ọchịchị ahụ.


N'okwu ya oge ọ na-anabata ihe ndị ahụ n'aha gọọmenti, onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka North' , bụ Maazị Ferdinand Onwuje kọwara akparamagwa na ònyìnye afọ òfùfò ndị nkuzi ahụ dịka nke magburu onwe ya nakwa ihe ọ tụghịdị anya ya chaa-chaa.

Dịka ọ na-agba akaebe na ndị nkuzi ahụ na-eme nke ọma n'ịkwàdo na ịkwàlite ọnọdụ mmụta n'ime okpuru ọchịchị ime obodo ahụ; Maazị Onwuje kelekwazịrị ha maka ọmarịcha omume ahụ nakwa ezi ọrụ ndị ọzọ ha na-arụ, ma kwe nkwà na ọ ga-aga n'ihu inye ha nkwàdo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.