Mmeri nke maazị Trump na ntụliakaelu mba Amerịka akpalitela ngagharị iwe na mba ahụ

Mmeri nke maazị Trump na ntụliakaelu mba Amerịka akpalitela ngagharị iwe na mba ahụ

Nov 10, 2016 - 18:48
Jan 19, 2021 - 18:49
 0
Mmeri nke maazị Trump na ntụliakaelu mba Amerịka akpalitela ngagharị iwe na mba ahụ

Puku kwuru puku ndị mmadụ pụtara n’okporo ụzọ na steeti dị iche iche na–eme ngagharị iwe gbasara mmeri Donald Trump nwetere na ntụli aka elu nhọpụta onye isi ala mba Amerịka.

Ọtụtụ n’ime ndị ahụ na–eme ngagharị iwe na-eti mkpu na-asi:

“Ọ bughị onyeisiala m”.

Ndị ọzọ were ịhe E sere ese gosiri isi anwụ anwụ Donald Trump gbaa ya ọkụ.

Maazị Donald Trump ga-abụ onye isi ala mba Amerịka nke iri anọ n’ise ka o nwetachara nturu ugo A tụghị anya ya nke o jiri merie ori aku Hillary Clinton.

O na-ejikere izute onye isi ala mba ahụ ugbu a, bụ Barack Obama n’obi gọọmenti mba ahụ maka ịhazi usoro nnyefe ọchịchị ga-esi ga siriri werere.

Maazị Obama, onye kwuputarala na maazị Trump ezughị ka e mee maka ọkwa onye isi ala mba ahụ, ma gwa ndị mmadụ sị onye atụrụna ya votu, gwara ụmụ afọ mba Amerịka ka ha nabata ka okwe siri gbaa na yabu ntụli aka elu E mere ụbọchị Tuzdee.

N’okwu nke ya, oriakụ Clinton, onye E meriri na ntụliakelu mba Amerịka ahụ, gwakwara ndị na-adonyere ya ụkwụ na E kwesiri ịnyere maazị Trump ohere ka Ọ chịa.

N’agbanyeghị oku ndị ndu abụọ ndị a kpọrọ, ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe, ka gbakọkwara n’obodo dị iche iche na mba Amerịka.

Na Steeti New York, puku kwuru puku ndị mmadụ gagharịri n’ogige ụlọ elu Trump Tower na-ekwupụta ọjụjụu ha n’amụma maazị Trump ji gbasara njem mbiri, atụmatụ iwu metụtara nwoke ịlụ nwoke ibe ya ma ọ bụ nwanyị ime otu ịhe ahụ.

Ozi kwuru na ndị na-eme ngagharị iwe megide nhọpụta maazị Trump nọchichara okporo ụzọ awara-awara na nnukwu obodo Los Angeles.

N’otu aka ahụkwa, ọtụtụ ndị mmadụ nọchichara ụzọ E si abanye ogige Trump Tower na-ekwupụta nwute ha nwere gbasara nhọpụta maazi Trump dịka onye isiala.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.