Na Bayelsa, Mmadụ Ise Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Aug 28, 2021 - 21:15
 0
Na Bayelsa, Mmadụ Ise Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mmadụ ise zutere ọnwụ mberede ha, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nwetara mmerụahụ n'ụdị dị iche iche n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara na mpaghara ụzọ Tombia-Amassoma dị na steeti Bayelsa.

Ihe mberede ahụ wètèrè agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ahụ, ma bụrụkwa nke wetere ọnwụ ike ụmụnwaanyị atọ na ụmụnwoke abụọ n'ebe ahụ ngwangwa o mere.

N'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Bayelsa, bụ SP Asinim Butswat mèrè ka a mara na na ọ bụ oge ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere ise nke mgbede ụbọchị Tọzdee ka ihe mberede ahụ dapụtara.

O kwukwara na ihe mberede ahụ dapụtara n'etiti ótù ụgbọala 'Toyota Venza' (nwere ákàrà N0. KMK 617 BY) na Keke Napep abụọ (nwere ákàrà NSK 073 QH na ákàrà LND 223 QH).

O mere ka a mara na ọ bụ ozu mmadụ ise ka e buputere n'ebe ahụ ya bụ ihe mberede mere, ma kọwaa na e mechaara chọpụta na mmadụ atọ n'ime mmadụ ise bụ Maazị Okon Daniel (gbara ahọ iri anọ na asaa), Maazị Oweinkuro Profit (gbara ahọ iri ise na abụọ), na Oriakụ Domoye Ikpaipai (gbara ahọ iri asaa na atọ).

Ọ kọwara na otu onye n'ime ndị ahụ bụ nwata akwụkwọ mahadum 'Niger Delta University, Amassoma', ma kwukwazie na ndị uweojii ka na-achọgharị otu onye a kpọrọ Buthurst Augusta Nyoun, onye e kwuru na ọ bụ ya nyà ụgbọala 'Toyota Venza' ahụ kpatara ya bụ ihe mberede, ma bụrụkwa onye gbara ọsọ ozigbo ihe mberede ahụ mere. 

N'okwu nke ya, onye ọrụ ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps, FRSC' (ngalaba steeti Bayelsa), bụ Maazị Soroh Tonye, gbakwàrà akaebe na mmadụ ise nwụrụ n'ihe mberede ahụ ma kwuo na a na-atụ anya na ọ bụ ịgba oke ọsọ n'oge mmiri na-ezo kpàtàrà ihe mberede ahụ. Ọ kọwara na ọ bụ mmadụ anọ n'ime mmadụ ise ahụ nwụrụ ozigbo, ebe otu onye nke ọzọ nwụrụ n'ụzọ oge e bu ya aga ụlọọgwụ.

O kwuru na ndị ọzọ nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ nọ n'ụlọọgwụ 'Niger Delta University Teaching Hospital' dị n'Okolobiri, n'okpuru ọchịchị Yenagoa anara ọgwụgwọ ugbua.

Ọ dụrụ ndị na-anya ụgbọala ọdụ ka ha zeere ịgba oke ọsọ, n'ihi na nke ahụ so n'otu ihe kacha eweta ihe mberede okporoụzọ, ọkachasị ugbua mmiri na-ezo, maka na ụzọ na-amị amị ma mmiri zòó.

O kpekwazịrị ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakere, nwere onwe ha oge adịghị anya, ma kpekwa ka Chineke nabàta mkpụrụobi ndị nke nwụrụ anwụ zuru ike na ndokwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484