Na Delta, E Jidela Onye Ọkada Kwasoro Onye O Bu n'Ọgbaatumtum Iko n'Ike

May 9, 2021 - 21:13
May 30, 2021 - 18:18
 0
Na Delta, E Jidela Onye Ọkada Kwasoro Onye O Bu n'Ọgbaatumtum Iko n'Ike

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ agadi nwaanyị kachie ntị wụọ aja, e bute ozu ya n'ofe nke ọzọ.

Ka ọ dị taa, otu onye ji ọgbaatumtum akpa ego na steeti Delta, bụ nke a maara dịka Ọkada, nọ ugbua wee na-akwa ngarammara, ma na-atakwa ikikere eze banyere ndụ ya na akparamagwa ya, dịka ọ machara otu nwaanyị o bu n'ọgbaatumtum elu n'ike.

Onye Ọkada ahụ, bụ Maazị Michael Ovie (gbara ahọ iri atọ na isii, ma bụrụkwa onye obodo Ọghara, dị n'okpuru ọchịchị 'Ethiope West' nke steeti ahụ) ka e kwuru na o ji ngwa ọgụ dagà wee yie nwa agbọghọ ahụ o bu n'ọgbaatumtum ya égwù, ma rie ya ọkọmbọ n'iké.

Akụkọ kọrọ na nwoke ahụ buru nwata nwaanyị ahụ wee gbagide n'ụzọ, tinyezie isi n'ọhịa; ma mgbe o ruru ebe ahụ, o weputazịrị daga ahụ wee yie ya égwù na ọ ga-asụgbu ya ma ọ bụrụ na o kweghị emepere ya. O wee si etu ahụ wee mazụrịa nwata nwaanyị ahụ.

Ya bụ oke mkpi na-agbara ọha ewu bùrù ụzọ wee nakọrọsịa nwaanyị ahụ ihe dị iche iche o nwere, ma ekwentị ya na ihe ndị ọzọ, tupu o wee tụọ ya n'ala, ma kọrịa ya n'iké.

Ụfọdụ ndị obodo ahụ maara onye nwoke ahụ bụ gbàrà akaebe na ọ kwasola ọtụtụ ụmụnwaanyị o bu n'ọgbaatumtum iko n'ike ọtụtụ ugboro, nke gosiri na nke ahụ abụghị nke mbụ ọ na-eme ụdị ihe dị etu ahụ; naanị na iko ya ejula, nke mezịrị na ọ lapụghị ya na nke ikpeazụ a.

Ka o sila dị, n'ajụjụọnụ a gbara nwoke ahụ oge onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Ari Muhammed Ali na-akpụgharị ya n'isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ; o mèrè ka a mara na ọ bụ naanị nwaanyị ahụ ka ọ kwasogoro iko n'iké na ndụ ya. Ọ gara n'ihu kọwaa na ihe ahụ o mere bụkwanụ n'ihi ihe ụmụnwaanyị na-eme ya ka ọ chọrọ ka o megwara, naanị na ekwensu batazịrị n'ime ya, o wee mefèzie ya ófè.

Dịka o siri kwuo, ụmụnwaanyị agbawaala ya obi ọtụtụ oge, nke na ọ na-abụ ọ gbachaa ha asa, ha richaa ego ya, ha awaa, ha agaghị ekwe mepere ya; ihe ahụ wee na-ewute ya na mkpụrụobi, nke mezịrị o ji chọọ isi n'ụzọ ahụ wee bọọ ọbọ ihe ha mere ya, n'ihi na nwaanyị ahụ o mere ihe ahụ yìrì otu onye n'ime ụmụagbọghọ ahụ kpagoro ya ụtazị n'isi.

O kwuru na ọ malitere ịkwa arịrị banyere ihe ahụ o mere kemgbe ahụ o mechara ya, ma na-ekpekwazịrị Chineke ka ọ gbaghara ya n'ihi na ọ maghị ụma, tinyekwuoro na ọ bụ akaọrụ ekwensu.

N'okwu nke ya, onyeisi ndị uweojii ahụ, bụ Maazị Ali mere ka a mara na ha nwụchikọrọ ya bụ nwoke site na njikọaka ndị ọrụ agha ala Nigeria n'elekere iteghete nke anyasị, ma kwuo na ọ bụghị naanị na ọ na-eji ọkada ya eburu ụmụagbọghọ wee baa n'ime ọhịa n'abalị ebe ọ ga-anọ wee kwaso ha iko n'ike; kama na ọ na-ezukwa ụmụnwaanyị ahụ ohi, site n'ịnakọrọsị ha àkpà ha na ihe ndị ọzọ dị iche iche ha ji ebe ahụ.

O kwuru na oge ahụ ha jidechara nwoke ahụ, na ha nwètàsịrị ụfọdụ ihe dị iche iche o zutere site n'aka nwaanyị ahụ ọ kwasoro iko n'aka ya, nke gụnyere ekwentị na ihe ndị ọzọ. 

CP Alị gakwara n'ihu kwuo na e nwetara 'sim card' iri na asatọ, ekwentị asatọ, ọkụ (torch), ATM ụlọakụ U.B.A. atọ, na ihe ndị ọzọ n'aka nwoke ahụ, ma kwuo na a ga-akpụpụ ya na ndị omekoome ndị ọzọ e jidere ụlọikpe, ngwangwa e mechara nnyocha banyere arụrụala ha dị iche iche 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484