Na Kogi, Ndị Nta Ejidela Ndị Omekoome Anọ

Jun 13, 2021 - 21:57
 0
Na Kogi, Ndị Nta Ejidela Ndị Omekoome Anọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na agbataobi onye bụ onye nche ya.

N'ịgbasò nke a, ndị na-achụ nta n'okpuru ọchịchị Okehi nke steeti Kogi nọrọ na nsonso a wee nwụchikọọ mmadụ anọ, bụ ndị omekoome na-eyi ndị na-anyà ụgbọala égwù ma na-emekpàkwa ha ahụ na mpaghara ụzọ awara-awara ahụ siri Okene gaa Lokoja na steeti ahụ.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ odeakwụkwọ mgbasaozi Gọvanọ steeti ahụ, bụ Maazị Onogwu Mohammed, bụ onye kwuputàrà ya site n'ozi ọ kụpụrụ n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ Facebook ya.

O mere ka a mara na ndị nta ahụ nọkwara n'abalị ahụ wee bibie ọhịa ebe ha jiri mere ugbo ebe a na-akọpụta ìgbó, bụ nke ndị omekoome ahụ nwe, ma bụrụkwa ebe ha na-emepta ọgwụ ike dị iche iche.
 
Dịka o siri kọwaa, ndị omekoome ahụ nwèkwàrà ụdị nkịta pụrụ iche ha na-azụ n'ebe ahụ maka ịtàgbù na ịchụpụ onye ọbụla tinyere ụkwụ ebe ahụ maọbụ wakpo ha n'ebe ahụ

Ọ gara n'ihụ kọwaa na oge ndị nta ahụ wakpòrò ebe ahụ, na ha nwụchikọrọ mmadụ anọ n'ime mmadụ ndị omekoome iri nọ n'ebe ahụ, ma gbuo nkịta isii ha zụpụtara n'ebe ahụ, ma ndị nke bịara ịwakpò ha ma ndị ọzọ ha hụrụ n'ebe ahụ.

Mohammed mere ka a mara na nnyòcha ka na-aga n'ihu banyere ndị omekoome ahụ a nwụchikọrọ nà arụrụala ha, ma kọwaa na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha banyere arụrụala ha na ihe ha mere.

O jikwazịrị ohere ahụ wee dụọ ndị omekoome ọdụ ka ha kwakọrọ ngwongwo ha pụọ na steeti ahụ, maọbụ chegharịa, maka na steeti ahụ abụghị ebe obibi maka na steeti ahụ abụghị meke ndị arụrụala na ndị omekoome, maka na oke ji nà àbàlà anaghị azọ ihu

The hunters in a night raid also destroyed the indian hemp farm belonging to the suspected criminals.

A Facebook post by the Chief Press Secretary to Governor of Kogi State, Onogwu Mohammed, on Sunday explained that the suspected criminals turned the forest into Indian hemp farm.

The post also revealed that the suspected bandits train special breed of dogs to ward off anyone coming into their territory, thus making the area inaccessible for security personnel.

According to Onogwu, during the raid, four of the bandits were arrested, while ten of their guard dogs were killed.

The Chief Press Secretary, while quoting the Chairman of Okehi Local Government Area, Hon Abdulraheem Ohiare who led the operation, warned that Kogi State is a no go area for criminal elements.

He added that the State Government will continue to hunt down criminal elements found within the State.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484