Na Kwara, Ndị Uweojii Ejidela Onye Ọgwụego Ji Isi na Aka Mmadụ Eme Njem

May 7, 2021 - 16:25
 0
Na Kwara, Ndị Uweojii Ejidela Onye Ọgwụego Ji Isi na Aka Mmadụ Eme Njem

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Igbo sị na ajọ ihe na ezi ihe agaghị agwụ agwụ n'ụwa; ma sịkwa na ọ bụ njọ ka a ka anụ, maka na ndị ọjọọ karịrị ndị ezi mmadụ.

Ka ọ dị taa, aka ndị uweojii na steeti Kwara anwụchiela otu nwoke bụ Maazị Kehinde Moses ka o bukọsị isi na aka mmadụ n'àkpà wee na-eme njèm, isi na mpaghara Ajase-Ipo nke steeti ahụ wee gaa Illorin, bụ isi obodo steeti ahụ.

Ya bụ nwatanwoke gbárá ahọ iri abụọ na anọ ka e kwuru na o kechisiri isi na aka mmadụ ahụ ike ma fọnye ya n'akpà, nke na ọ gaghị adịrị onye ọbụla mfe ịma na ọ bụ akụkụ ahụ mmadụ ka o bu n'akpa.

Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Ajayi Okasanmi siri kọwaa, onye ya na nwoke ahụ so were abagide na njem ọjọọ ahụ (bụ onye òtù ya) rìrì mbọmbọ ọsọ ngwangwa ndị uweojii kwụsịrị ụgbọala Bọọsụ ahụ ha nọ na ya n'okporoụzọ ka ha nyochaa ya; e wee nwụchikọọ naanị ya onwe ya. 

Kaosiladị, mgbe ndị ahụ malitezịrị inyocha ụgbọala ahụ na onye ọbụla nọ n'ime ya, a hụrụ àkpà ahụ Moses bu, wee meghee ya, wee hụ na ọ bu isi na aka nwatanwoke e gburu ọhụrụ n'ime ya.

Ka ha hụrụ nke ahụ, e jidezịrị ya bụ nwa amadi, wee họọ ya aka ururu họrọ ogbe ògìrì, dịka a na-agba ya ajụjụọnụ; o wee sàá asịsị ma kwuo nke bụ eziokwu, sị na ọ bụ ya na onye òtù ya ahụ gbárá ọsọ gburu nwata nwaokorobịa ahụ aha ya bụ Mohammed n'Ajase-Ipo, ka ha were ya wee gwọọ ọgwụ ego. O mekwara ka a mara na ọ bụ akụkụ ahụ ndị a gwara ha weta ka ha bèkọọrọ, wee dọhapụzie ozu ya n'ebe ahụ ha gburu ya.

N'ime nnyòcha, Moses durukwara ndị uweojii ahụ wee ga gosi ha ebe ha dọbara ozu nwata nwaokorobịa ahụ, e wee buru ya gaa ụlọọgwụ maka ime nnyocha.

Ka ọ dị ugbua, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Mohammed Bagega enyela ntụziaka ka e nyefèé okwu ahụ n'aka ngalaba ọrụ uweojii na-ahụ maka ọchụ ụlọ, ka e wee mee nnyocha ghe anya oghe banyere ya ma nwụchikọọ ndị niile aka ha dị na ya.

.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484