Na Lagos, Ndị Uweojii Anwụchiela Ụmụaka Atọ Bu Égbè na Mgbọ Égbè

Nov 26, 2021 - 22:45
 0
Na Lagos, Ndị Uweojii Anwụchiela Ụmụaka Atọ Bu Égbè na Mgbọ Égbè

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ngalaba mgbata ọsọ ngwangwa a maara dịka 'Rapid Response Squad (RRS)' nke ụlọọrụ uweojii na steeti Lagos nọrọ na nsonso a wee nwụchikọọ mmadụ ise, nke mmadụ atọ n'ime ha bụ ụmụaka erubèghị ahọ iri abụọ, ka ha bù egbe na mgbọ egbe wee na-akpagharị na mpaghara Ajah nke steeti ahụ.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi a kụpụrụ n'usoro nzikọrịtaozi Facebook nke ngalaba ọrụ uweojii ahụ, n'aha onyeisi ha bụ CSP Yinka Egbeyemi.

Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, égbè e nwetere n'aka ndị ahụ gụnyèrè 'Pump-action', nsụnsụ egbè na mgbọ egbe agbabèghị agba ruru iri abụọ na otu n'ọnụọgụgụ.

E nyere aha ndị ahụ dịka Maazị Ayomide Adeolu (gbara ahọ iri abụọ na anọ), Quam Olanrewaju (gbara ahọ iri na iteghete), Oladele Giwa (gbara ahọ iri na isii) Basit Adams (iri na asaa) na Ayinde Abibat (gbara ahọ iri abụọ).

Akụkọ kọrọ na ndị ahụ bù egbe ahụ na mgbọ egbe ahụ wee na-aga na mpaghara Langbasa, ka ha nwechaara nzukọ na 'Alpha Beach' dị na Lekki.

Oge ndị uweojii ahụ nọ n'ọrụ n'Ajah, ha kwụsịrị otu ụgbọala 'RAV4' nwere aka efere aTEPAOJE' wee malite inyòcha ụgbọala ahụ na ịgba ndị nọ n'ime ya ajụjụọnụ. Ọ bụzị oga ha na-eme nke ahụ ka ha hụrụ ebe d zoro égbè, mgbọ egbe na ọgwụ a gwọrọ agwọ n'ime ụgbọala ahụ. E wee nwụchikọọ ha ma bukọtasịkwa ihe ahụ ha zoro n'ụgbọala ahụ.

Onye nya ụgbọala ahụ, bụ Maazị Ayomide Adeolu nyèkwàzịrị ndị uweojii ahụ ozi dị mkpa ga-enyere ha aka iji nwụchikọkwuo ndị ọzọ aka ha dị n'ihe ahụ.

CSP Egbeyemi kọwara na ya enyefèéla okwu ahụ n'aka ngalaba na-ahụ maka ya maka imekwu nnyocha banyere ya, dịka onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Hakeem Odumosu siri nye ntụziaka.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484