Na Mpaghara Amansea, Gọọmenti Anambra Amalitela Ọrụ Mmetụaka Ụzọ Enugu—Onitsha

Sep 17, 2021 - 23:29
 0
Na Mpaghara Amansea, Gọọmenti Anambra Amalitela Ọrụ Mmetụaka Ụzọ Enugu—Onitsha

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-adị mma ede kaa nka n'anya, a banyere ya aja n'ukwu.

N'ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra amalitela ịrụ ọrụ mmetụaka na mpaghara Amansea nke okporoụzọ awara-awara ahụ si Enugu gaa Onitsha, iji mee ka ya bụ ụzọ dịtụ mma ịga aga.

Ọ dị ncheta na o teela ọtụtụ ndị mmadụ na ndị òtù dị icheiche jiri kpọba gọọmenti etiti òkù ka o mee ihe bànyere ụzọ ahụ, iji belatara ndị na-eme njem ihe nhịahụ ha na-agabiga n'ịgba n'okporoụzọ ahụ, bụ nke kawanyere njọ n'oge udummiri a, ma dịkwazie imi na ọnụ ka ntọọ.

Ọ dịkwa ncheta na ọchịchị gọọmenti steeti Anambra dozigharịrị mpaghara okporoụzọ ahụ dị n'Awka nbụ isi obodo steeti ahụ, ma rụọ àkwà atọ na ya, n'agbanyèghị na ọ bụ okporoụzọ gọọmenti etiti ka ọ bụ.

Ka ọ dị taa, gọọmenti steeti ahụ amàlitekwala ọrụ mmetụ aka na mpaghara Amansea nke okporoụzọ ahụ, iji mee ka ọ katụ mma.

N'okwu ya banyere nke ahụ, Odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ngo na steeti Anambra, bụ Ọkaiwu Emeka Ohuoha mere ka a mara na ọ bụ n'izuụka gara aga na ha malitere ọr ahụ, ma kọwaa na ọ bụ ọchịchị steeti ahụ nyere ụlọọrụ ya ntụziaka ka o bagide na ya bụ ọrụ, n'ihi ajọ ọnọdụ okporoụzọ ahụ nọzị na ya ugbua.

O kwuru na kemgbe ha jiri malite ọrụ ahụ, na ha ekpochiela ụfọdụ ebe idei mmiri kpaara n'okporoụzọ ahụ, ma kpochikwa ụfọdụ ebe miri àlà n'okporoụzọ ahụ, bụ nke omimiàlà ya ruru mita abụọ. O mere ka a mara na ọtụtụ ụgbọala emebiela n'ebe ahụ n'iji ajọ ọnọdụ okporoụzọ ahụ, ma kwukwazie na ha bupurusiri ọtụtụ ụgbọala dịchisiri ụzọ ebe ahụ tupu ha malite ya bụ ọrụ.

Dịka ọ na-akọwa na ha edoziela mpaghara okporoụzọ ahụ, nke na ụgbọala ga-agbanwuzịkwa na ya ugbua n'enweghị ọtụtụ ihe mkpọbiụkwụ; o kwukwazịrị na ha ga-arụcha ọrụ ahụ oge adịghị anya, ọbụladị dịka ọ kpọkukwazịrị gọọmenti etiti ka ọ gbata ọsọ enyemaka ngwangwa n'okporoụzọ gọọmenti etiti dịgasị na steeti ahụ, iji belatara ndị mmadụ ihe isiike na ihe nhịahịahụ ha na-agabiga n'okporoụzọ ahụ.

N'ajụjụọnụ a gbara ha, ụfọdụ ndị na-agba n'okporoụzọ ahụ, nke gụnyere Emeka Eze na Oriakụ Uju Nwosu kelere gọọmenti Anambra maka mgbataọsọ ya n'okporoụzọ ahụ, ma rịọkwazie ya ka o jisie n'ọrụ. Ọ kpọkukwazịrị gọọmenti etiti ka o welitekwuo aka n'ọrụ ahụ ọ na-arụ n'okporoụzọ ahụ na steeti ahụ, n'ihi na ọrụ ahụ na-akpụzị ka ejula ugbua kemgbe, ebe okporoụzọ ahụ na-akawanyekwazị kwà n'ụbọchị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484