Na Niger, Ọkụ Agbagbuola Ụmụaka Ntaakara 20 n'Ụlọakwụkwọ

Apr 24, 2021 - 21:22
Apr 25, 2021 - 17:05
 0
Na Niger, Ọkụ Agbagbuola Ụmụaka Ntaakara 20 n'Ụlọakwụkwọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Anyammiri gara na nsonso a dịka ọkụ ọgbụgba gbagburu ụmụaka ntaakara (nursery) dị iri abụọ n’ọnụọgụ na mba Niger, n’izuụka gara aga. Ọkụ ahụ gbachibidoro ha na klaasị ụlọ akịrịka (straw-hut classrooms) ha na-agụ akwụkwọ.

Onyeisi ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ mba ahụ, bụ Colonel Bako Boubacar kwuru sị na ọtụtụ n’ime ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ obere ụmụaka; tinyere na amatabeghị ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ na Niamey.

Otu onyenkuzi so n’òtù jikọtara ndịnkuzi Niger kwuru na ụlọakwụkwọ ahụ nwèrè ihe dịka ụmụakwụkwọ narị asatọ, ndị gụnyere ụmụaka nọ na ntaakara.

Mounkaila Halidou kwuru sị: “Ọkụ ahụ malitere site na geeti ụlọakwụkwọ. Ebe e nweghị ebe ọzọ a ga-esi gbapu, ọtụtụ ndị mmadụ tọkịịrị n’ime, ebe amanyere ụmụakwụkwọ ka ha maa elu aja wee gbapụ. Ndị nwụrụ anwụ bụkarịchara ụmụaka ndị ka nọ na ntaakara.”

Onye ọrụ nsọnyụ ọkụ ọzọ kwuru na ọkụ ahụ gbagworo klaasị ụlọ akịrịka dị iri abuọ na otu nke ụmụaka tọkịịrị n’ime ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484