Na Nnewi: Gọọmenti Anambra Akụtùóla Ụlọ A Rụrụ n'Okpuru Eriri Ọkụ Latirik

May 6, 2020 - 20:00
Jan 22, 2021 - 21:24
 0
Na Nnewi: Gọọmenti Anambra Akụtùóla Ụlọ A Rụrụ n'Okpuru Eriri Ọkụ Latirik

Izunna Okafor, Awka

N'ihi na a sị na ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ, gọọmenti steeti Anambra akụtùóla otu ụlọ na Nnewi dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Nnewi North, bụ nke a rụnyere n'okpuru eriri ọkụ latirik, ma bụrụkwa nke ọrụ ka na-agawanye n'ihu na ya tupu a kụkpọọ ya.

Ya bụ ụlọ bụ nke a kụtùrù site n'aka ụlọọrụ gọọmenti steeti ahụ na-ahụ maka ewumewụ na steeti ahụ, bụ ụlọọrụ 'State Physical Planning Board' (bụ SPPB n'aha ịchafụ bekee), bụkwa ndị nọrọ n'oge ahụ wee kàá ụfọdụ ụlọ ndị ọzọ a rụkwara n'ebe ezighị eze akàrá nkụtù.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, onye duru ndị ahụ wee bàgide n'ọrụ ahụ, bụ Maazị Chike Maduekwe kọwàrà na onye rụrụ ya bụ ụlọ agbasoghị ntụziaka maọbụ nweta nkwàdo ụlọọrụ SPPB ahụ tupu wuo ya bụ ụlọ, n'ihi ya bụ ụlọọrụ apụghị inye ntụziaka maọbụ nkwàdo ka a rụọ ya bụ ajọ ọrụ n'ebe ahụ.

O mere ka a mara na ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ latirik, bụ ụlọọrụ 'Enugu Electricity Distribution Company' (EEDC) agaala n'ihu na-ewètara ha akwụkwọ ozi na mkpesa banyere ụfọdụ ndị dị iche iche kachiri ntị na-arụnyesị ụlọ na ihe ewumewu dị iche iche n'ebe ezighị ezi, ọkachasị n'okpuru ebe eriri ọkụ gara.

Maazị Maduekwe gara n'ihu gwa ndị nwegasị ụlọ ahụ a kàrà akàrà nkụtù ụbọchị ahụ ka ha were ọsọ were ije wụchaa n'ụlọọrụ ahụ n'izuụka a, ọbụnadị dịka ọ dọrọ aka na onye ọbụla bagidere n'ịrụ ihe ọbụla ọzọ n'ebe iwu akwadoghị, ga-abụ onye a ga-anwụchi, tụọ mkpọrọ, ma kpụpụkwa ya ụlọikpe.

Na ntụnye nke ya, onyeisi oche òtù ọrụ na-ahụ maka àlà n'ụlọ omeiwu steeti ahụ, ma bụrụkwa onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Idemili North n'ụlọ omeiwu ahụ, bụ Maazị Arthur Chiekwu dọrọ ọha mmadụ aka na ntị, ọ kachasị ndị na-arụnye ihe ebe ezighị ezi, ka ha mara na e nwere iwu megidere nke ahụ.
O nyekwazịrị ndụmọdụ ka ha na-agbasò ntụziaka ụlọọrụ ahụ, ma na-erubekwa isi nye iwu gọọmenti dị iche iche na-achị ewumewu ụlọ, tupu ha abagide n'iwube ihe ọbụla, maka 'ngara m mara' ikpè azụ.

Ndị dị iche iche soro bàgide n'ọrụ ahụ ụbọchị ahụ gụnyèrè onye jigodi ọkwa ugbua dịka onyeisi ụlọọrụ SPPB, bụ Maazị Nwabufo Anene; onyeisi òtù jikọtara ndị na-ere akụkụ ọgbatumtum n'ahịa Nkwọ Nnewi, bụ Maazị Obinna Okechukwu, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.