Na Steeti Oyo, Ọkụ Agbarikọọla Ọtụtụ Ihe n'Ahịa Sabo

Mar 6, 2021 - 12:38
 0
Na Steeti Oyo, Ọkụ Agbarikọọla Ọtụtụ Ihe n'Ahịa Sabo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Anyammiri wụsịrịnnọọ ka mmiri ozuzo ụbọchị Tuzdee na steeti Oyo, dịka ọkụ ọgbụgba dabidoro ma gbarikọọ ọtụtụ ngwaahịa na ihe ndị ọzọ gburu ego ruru nde kwuru nde naịra n'ahịa Sabo dị na steeti ahụ.

Ya bụ ahịa Sabo bụ nke e kwuru na ọ bụ ahịa ebe a na-ere ihe a kọtara n'ugbo kacha wee buo ibù na steeti ahụ, ma bụụkwa nke ọkụ ọgbụgba ahụ malitere na ya n'elekere iri nke abalị ụbọchị Tuzdee, wee gbarikọọ ma ngwaahịa ma ngwongwo ndị mmadụ n'ebe ahụ.

Ndị ọnọmgbeomere kwuru na a kpọrọ ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ ozigbo ọkụ ahụ malitere, mana tupu ha gbakàrịchaa ala ka ọkụkọ na-eyi akwa wee bịaruo n'ebe ahụ, ọkụ agbarikọchaala ọtụtụ ihe na ya bụ ahịa.

N'okwu ya banyere ọkụ ọgbụgba ahụ, onyeisi ọrụ nsọnyụ ọkụ na steeti ahụ, bụ Maazị Moshood Adewuyi kwuru na ya bụ ọkụ gbara n'ahịa ahụ n'ezie, ma kwuo na ọ bụ ọdụ ahịa atọ ka ọkụ ahụ gbarikọrọ n'ebe ahụ.

O kwuru na ọ bụ ebe a na-ekpofu ahịhịa dị na nso ahịa ahụ ka ya bụ ọkụ ọgbụgba siri wee malite, wee banyezie n'ahịa ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ọ bụ oge ọ fọdụrụ nkeji iri atọ ka ọ kụọ elekere iri na otu nke abalị ka e jiri wee kpọtụrụ ha banyere ọkụ ọgbụgba ahụ; ha wee gbara gaba n'ebe ahụ ozigbo, maka na ụlọọrụ ha dị nso na ya bụ ahịa.

O kwuru na mgbe ha ruru n'ebe ahụ, na ha hụrụ na ọ bụ ọdụ ahịa asatọ ka ọkụ ahụ metụtagoro, ha wee gbochie ya ka ọ gharazie ịgbasà maọbụ banye n'ọdụ ahịa ndị ọzọ o metụtabeghị. O mekwara ka a mara na ọ bụ mkpụrụ kachúù, nkàtà na ụfọdụ ihe ndị ọzọ ka ha hụtara n'ime ọdụ ahịa ahụ.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ndị ahụ ekwesighị ịdị na-ekpofù maọbụ na-agba ahịhịa ọkụ na gburugburu ahịa ahụ, ebe ha ma na ha nwere ngwaahịa gburu ego ruru nde kwuru nde naịra n'ahịa ahụ.

Ọ sị na ndị ahụ mụyere ọkụ n'ahịhịa dị n'ebe ahụ ha na-ekpofu ahịhịa n'ahịa Sabo ahụ, hapụrụ ya wee pụọ, n'anọghị leruo ya anya ka ọ gbachaa; ọkụ ahụ wee nwubànyezie n'ahịa ahụ, wee gbarikọọ ọtụtụ ihe.

Ọ kpọkuzịrị ọhaneze ka ha kpachapụ anya etu ha na ọkụ si aga, ma gwakwazie ndị na-azụ ahịa ka ha gbaa mbọ hụ na ebe ha na-egbofu maọbụ na-esu ahịhịa ọkụ adịghị nso n'ahịa ha, iji wee gbanahị ụdị ajọ ọdachi dị etu ahụ ịdapụta ọzọ n'ọdịnihu.

Ọ kasikwazịrị ndị ọkụ ọgbọgba ahụ metụtara obi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484