Na Unizik, Ngalaba 'Mass Comm.' Emeela Ncheta Ọgbụgbà Ahọ Iri Abụọ Na Ise

Jun 14, 2021 - 20:39
Jun 14, 2021 - 20:55
 0
Na Unizik, Ngalaba 'Mass Comm.' Emeela Ncheta Ọgbụgbà Ahọ Iri Abụọ Na Ise

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zuọ azụọ na nsonso a dịka ngalaba ọmụmụihe gbasaara mgbasaozi, bụ 'Mass Communication' nke Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka merùbèrè mmemme nchèta ọgbụgbà ahọ iri abụọ na ise o jiri màlite.

Oke mmemme ahụ wééré ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra dọtàrà ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị iche iche, ndị sitere mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria wee bịa, ma bụrụkwa mmemme a nọrọ na ya wee nabàta ma guzobe òtù jikọtara ndị gụrụ akwụkwọ na ngalaba ọmụmụ ihe ahụ n'oge gara aga.

N'okwu ya na mmemme ahụ, nnukwu onye ọbịa pụrụ iche ma bụrụkwa onye ndụmọdụ pụrụ ichè nye onyeisiala Nigeria n'ihe gbasaara mgbasaozi, bụ Maazị Femi Adesina kpọkùrù ndị ntaakụkọ ka ha bụrụ ndị ga na-esite na mgbasaozi ha na-akwàlite udo na ịdịnotu, mmepe na ọganihu obodo, nàkwà ọnọdụ nchekwa, karịa ịbụ ndị na-aghasa aghasà.

Adesina, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ Ọkammụta Nnaemeka Agbanu nke Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, kọwara ndị ntaakụkọ dịka nwere ike pụrụ iche ma nwekwa nnukwu ọrụ n'ịkwàlite mmepe obodo ọbụla; ọbụladị dịka ọ kpọkuru ha ka ha zèére ihe ọbụla ga-eme ka ọnọdụ kawanye njọ n'ala Nigeria; kama ka ha jiri mgbasaozi ha kwàdo mwulite obodo.

N'okwu ya oge ọ na na-agbape mmemme ahụ, onyeisi mahadum Unizik, bụ Ọkammụta Charles Esimone, onye mere mmemme ncheta ọgbụgbà ahọ abụọ ya n'ọkwa ahụ na nsonso a, kwupụtànwòrò ezi ebumnobi ya nà nkwà ahụ o kwere oge ọ batara n'ọkwa ọchịchị na ọ ga-ebuli ụlọakwụkwọ ahụ ka ọ nọrọ n'ogoogo dị elu, nke na ọ ga-abụ mahadum kacha mma n'ala Nigeria, sòró na mahadum iri kacha mma na mba Afrịka, ma sòrókwazie na mahadum narị abụọ kacha mma na mba ụwa.

O kelekwazịrị ndị ọrụ na ụmụakwụkwọ ngalaba 'Mass Communication' mahadum ahụ maka ogoogo ha nọ na ya ugbua, ma kpọkuzie onye ọbụla ka o tinye aka n'ọrụ, iji hụ na e mezùpụtara ezi ebumnobi ahụ o nwere ime ụlọakwụkwọ ahụ ka ọ bụrụ ọkaibe.

Na mbụ n'okwu mmalite ya, onyeisioche na mmemme ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Igwebuike Mbanefo kọọrọ ụmụakwụkwọ mahadum ahụ etu ọnọdụ dị na mbụ nà etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ ugbua n'ala Nigeria, ma kọwaara ha na ọtụtụ ohere dị ugbua na ngalaba mgbasaozi na n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, bụ nke ha nwere ike isite na ya wee bàárá onwe ha uru, nọrọ n'ezi ọnọdụ dị elu, ma bụrụkwa ndị ihe na-agara nke ọma, n'agbanyeghị etu ọnọdụ ala Nigeria siri debe imi na ọnụ ugbua, nàkwà nsogbu na ihe iche aka mgba dị iche iche na-adọghachi aka elekere azụ n'ime ya .

N'ozi nnọọ ya, onyeisi ngalaba ọmụmụihe 'Mass Communication' bụ Ọkammụta Chinwe E. Uzochukwu nyère obere nkọwa bànyere etu ngalaba ahụ siri wee màlite, ma kelee onyeisi mahadum ahụ nà ndị dị iche iche tụnyegoro ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ n'ịkwàlite ọganihu na ọnọdụ mmepe ngalaba ahụ n'ime ahọ iri abụọ na ise gara aga; ọbụladị dịka o mekwàrà ka a mara na mahadum ahụ so na mahadum nọ n'ezi ihu na mbọ ahụ a na-agba ime ngalaba ọmụmụihe 'Mass Communication' ka ọ bụrụzie isi ngalaba ọmụmụihe a ga-akpọ 'Faculty of Communication and Media Studies' ma nwekwazie ngalaba ọmụmụihe asatọ n'ime ya.

Dịka ọ na-akpọpụtasị ụfọdụ ihe dị iche iche ngalaba ọmụmụihe ahụ mepụtàgoro n'ime ahọ iri abụọ na ise gara aga nà ihe na-akpa ha ugbua, Ọkammụta Ụzọchukwu mèkwàzịrị ka a mara na ngalaba ọmụmụ ihe ahụ ga-ebidozị ijikọ aka ọnụ, ya na ndị dị iche iche gụrụ akwụkwọ na ngalaba ahụ n'oge mbụ; ma kpọkukwazie onye ọbụla ka o tinye aka n'ọrụ ma tụnyekwa ụtụ nke ya iji gbòó mkpa dị iche iche na-echere ya bụ ngalaba ọmụmụihe ma kwàlitekwa agamnihu ya n'ụzọ pụrụ iche.

Na nkụzi ya na mmemme ahụ, Oriakụ Kasie Abone nyere nkọwa banyere ngalaba mgbasaozi, kpọpụtasịa ohere ọma dị iche iche dị na ya, ihe iche aka mgba dị na ya na etu a ga-esi gbanahị ya, ma kọwazie mkpà ọ dị inye ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ mgbasaozi ọzụzụ kwesiri ekwesi ka ha wee rụọ ọrụ ha nke ọma.

N'okwu ha n'otu n'otù, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo mpaghara Ebonyi etiti n'ụlọ omeiwu ala Nigeria, bụ Sinetọ Obinna Ogba; eze ọdịnala obodo Ịgbakwụ, bụ Igwe Ọkammụta Onuorah Nwuneli; onyeisioche otu ndọrọndọrọ 'African Democratic Party (ADC)', bụ Maazị Ralph Okey Nwosu; onye gbapere amụmà ịchụ nta ego na mmemme ahụ, bụ Maazị Godwin Agbasimelo (Oga Ndi Oga), nà ọtụtụ ndị ọzọ sonyere na ya bụ mmemme kèlere ngalaba ọmụmụihe ahụ ma dụọ ụmụakwụkwọ ọdụ ka ha gụsie akwụkwọ ike iji mee nke ọma.

A nọrọ na mmemme ahụ wee waa achịcha bekee e mere maka ọgbụgba ahọ iri abụọ na ise ahụ, bupụta akwụkwọ 'Unizik Comet Magazine' pụrụ iche e bipụtàrà site n'aka ngalaba ọmụmụihe ahụ; ma nyekwazie ọtụtụ ndị mmadụ onyinye nkwanyeùgwù site n'aka ngalaba ọmụmụihe ahụ. 

Ụfọdụ n'ime ndị ahụ e nyere nkwanyeùgwù gụnyèrè nwaanyị mbụ ruru n'ogoogo ọkammụta n'ọmụmụihe 'Mass Communication' na mpaghara ọwụwa anywanwụ Afrịka, bụ Ọkammụta Stella Okunna; Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti Anambra, bụ Ọkammụta Kate Omenugha; Ọkammụta Godson Okafor; Sinetọ Obinna Ogba; Dọkịta Nelson Omenugha, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

N'ozi ekele ya n'aha ndị òtù ya, nke gụnyere Dokịta Henry Duru, na Dọkịta Nelson Omenugha; onyeisioche òtù ọrụ haziri maka mmemme ahụ, bụ Dọkịta Odogwu Emeka Odogwu kèlèrè ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ nà ndị tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, iji hụ na ya bụ mmemme gara nke ọma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484